Ndị dọkịta Naịjirịa enwere ike ịjụ mbuli ụgwọ ka ndị Canada?

Ebe foto si, Getty Images
Ebe ndị dọkịta Naịjirịa na-ebe akwa na anaghị akwụlite ha ụgwọ ka ndị nke Canada na-ekwu ka ebutuo ụgwọ a na-akwụ ha.
Na Canada, ihe ruru dọkịta 500 na ndị na-amụ ịbụ dọkịta bịakọtara ọnụ depụta akwụkwọ ikwu na ha achọghị irizi nnukwu ụgwọ ọnwa.
Ha kwuru na ọ na-akpasu ha iwe na a na-ebuli ụgwọọnwa ha ebe ndị nọọsụ na ndị ahụ na-adịghị na-ata ahụhụ.
Ha kwuru na ọ ga-akara ha mma na-etighachịrị ego mara n'elu ụgwọ ọnwa ha n'ime ngalaba ahụike ha.
Nke a onwere ike ime na Naịjirịa?
N'agbanyeghị na kwa afọ ọtụtụ ndị Naịjiria na-abanye mahadum ịgụ maka ọgwụ na ịwa ahụ nke bekee kpọrọ, medicine and surgery, o meghị ka ọrụ zuoro ha n'obodo a.
Nke a kpatara na ọtụtụ n'ime ha na-achọ ụzọ igbaga obodo ndị ọzọ ịchọ ọrụ, ebe ndị nke na-agbafughị na-agba abụbụ ọrụ kwa mgbe kwa mgbe ka a kwụọ ha ụgwọ ma buliere ha ụgwọ ọnwa ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:
BBC Igbo jụrụ otu dọkịta aha ya bụ Aliyah ma ọ ga-agbaga obodo ọzọ ma ohere pụta, ọ sị "A naghị akwụ anyị ụgwọ ọfụma. Ọrụ anyị anaghị enye anyị ọṅụ. Ọ bụ ya mere na anyị hụ ohere iji apụ, anyị ewere ya.
"Ọ bụ ụra n'ihu ndị nọ n'ọchịchị Naịjirịa, ọ kwesịrị ka ha lebanye ya anya.
"Ngalaba ahụike anyị anaghị arụ ọrụ. Ndị nọ n'ọchịchị amaghị ihe ọbụla na-aga. E kwesịrị itinye uchu n'ihe gbasara ngalaba anyị maka na ọbụghị nanị anyị ka o metụtara. Ọ metụtara ndị ahụ adịghị."
Ego ole ka a na-akwụ ndị dọkịta?
Aliyah bụ dọkịta na-ahụ maka ọrịa isi mgbaka gwara BBC Igbo na dọkịta ndị na-arụ n'ụlọọrụ gọọmentị ka na-agbagote n'ọkwa na-eri ihe ruru puku naira 150, ebe ndị nọ n'isi na-eriru puku naira 400.
Ọ sịkwa na ndị na-anaghị arụ n'ụlọọgwụ gọọmentị anaghị eriru puku naira 150.
Gịnị na-eme ndị dọkịta na-eji agbaga obodo ọzọ?
- Ha na-arụ ọtụtụ ọrụ mana anaghị akwụ ha ụgwọ ọfụma
- Ndị ahụ na-adịghị karịrị ndị na-elekọta ha
- Ego a na-akwụ ha maka 'olileanya ihe mberede' bụ nanị puku naịra ise
- Ha nwere ọtụtụ ndị ha na elekọta anya n'ezinaụlọ ha mere ka ego ha hapụ izu ha ime ihe ndị ọzọ
Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2









