Ọgbaghara Taraba: Ghọta nụ na m na-arụ ọrụ - Buhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari

Ebe foto si, AFP/Getty

Onyeisiala bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọbụghị ebe ọbụla ọgbaaghara dị ka ọ ga-aga.

O kwuru nke a ebe ọ gara ileta ndị Taraba steeti ebe ọtụtụ ndị mmadụ nwụrụ n'ihe ike mere n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo ahụ.

Ọ sị na-ọdịghị mfe ị ga-ebe niile ihe mere n'ala Naịjiria ebe ọ bụ na o nwere ndị na-ewetara ya akụkọ ihe na-aga n'ala.

Ọ sị kwa na ihe mere oji gaa Taraba steeti bụ na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ ebe ahụ kacha ndị nke Benue na ndị Zamfara steeti.

Eserese na-egosi ebe mwakpo Mambila mere
Nkọwa foto, Mambila bụ ebe ọhụrụ enwere mwakpo n'etiti ndị ọchịehi na ndị mmadụ

Onye enyemaka Gọvanọ na-achị Benue steeti gwara BBC n'elu ekwentị na ha amabeghị mgbe onyeisiala ga-abịara ha mgbaru ụlọakwa ka o sị kwuo.

Mana ọ sị kwa na ha nwere olileanya na ọ ga-abụ mgbe Buhari ga-esi Ghana lọta.

BBC gbalịrị ịnweta Lai Mohammed n'ekwentị mana ka-anyị na-ede akụkọ a, onwebeghị isi.

Cheta nụ na ihe karịrị mmadụ iri nwụrụ n'ihe a mere n'etiti ndị ọchịehi na ndị obodo Mambila n'ọtụtụ ụbọchị gara aga.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ