Charly Boy: Iwe anyị bụ na a na-emechi ndị ntaakụkọ ọnụ

Charly Boy

Ebe foto si, Charly Boy

Nkọwa foto, Charly Boy ji otu ya #MumuDondo ajụ ndị ọchịchị ase etu ha si achị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ọ bụrụ na-enweghi ihe mgbochi ọbụla, ndị otu #Mumudondo nke Charles Oputa (Charly Boy) akwadosila njeghari iwe ha ga-eme n'Abuja ụbọchị Wednezde maka onyeisi ụlọọrụ mgbasa Daily Independent ndị ọrụ DSS jidere.

E jidere Tony Ezimakor n'Abuja maka akụkọ ndị ụlọọrụ Daily Independent mere gbasara ego e kwuru na ndị gọọmenti Naịjirịa kwụrụ ndị Boko Haram.

Ndị DSS ji Tony kamgbe ụbọchị 28 Feburuwarị afọ 2018 ka o kwuo ebe ha si weta akụkọ ahụ ha buru.

N'aka nke ọzọ, Charly Boy kwuru na ihe ndị DSS mere jọgburu udele sigbuo nkakwụ maka na Naịjirịa nwere iwu onye kwuo uche ya.

Aha onyonyo, Charly Boy ji otu ya #MumuDondo ajụ ndị ọchịchị ase gbasara etu ha si achị

Dịka o si gwa BBC Igbo - "Ndị ntaakụkọ na-agwa anyị etu Naịjirịa si aga, ndị gọọmenti mechicha ha ọnụ, ole ndị ga na-akọwara anyị na-agwa anyị eziokwu?"

O kwuru na dịka nwa afọ Naịjirịa, na ha nwere ike ime ngagharị kwuo etu ọchịchị si ewuta ha mana ha degara ndị ụweojii akwụkwọ ka ha mara maka ngagharị ahụ.

line

Ihe ndị otu #OurMumuDonDo na-ekwu

Otu ahụ dere n'akara ha na twita na ha chọrọ ka ndị DSS hapụ onye ọrụ Daily Independent ha ji.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Otu ndị dị ọzọ dịka Concerned Nigerians, Campaign for Democracy sonyere na ndị ga-eme ngagharị iwe ahụ.

N'aka nke ọzọ, ndị ụlọọrụ Daily Independent kpọkukwara gọọmenti etiti ka ha hapụ onye ọrụ ha ha jidere.

Otu ajụjụ dị ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ bụ ka gọọmenti Naịjirịa a na-egbochizi iwu onye kwuo uche ya?

line