Charly Boy ekwuola na ọ chọrọ ndị ntoroọbịa pụrụiche maka ịchị Naịjiria

Aha onyonyo, Charly Boy: Iwe m n'ebe Gọọmenti nọ

Onye ama ama dịka Eze ndị ntoroọbịa na Naịjirịa bụ Charly Boy kwuru na obi adịghị ya mma maka ọnọdụ Naịjirịa.

Mgbe ndị BBC Igbo gbara ya ajụjụọnụ, ọ jụrụ "Gịnị mere o jiri bụrụ ndị ọjọọ na-achị Naịjirịa?".

Charly Boy kwuru na ọ na-achọ ndị ntoroọbịa pụrụiche ọ ga-akwado maka ị were oche ọchịchị Naịjirịa.

"Ọbi na-agwa m kamgbe afọ iri atọ na ise gara aga na nzọpụta Naịjirịa ga-abụ maka ndị ntoroọbịa pụrụiche," dịka Charly Boy kwuru.

Ndị mere akụkọ a: Chimamaka Ihenacho

Akụkọ ndị ga-amasị gị: