NLC: Nke a bụ abalị abụọ agbagoro abụbụ ọrụ a

Ebe foto si, Stringer
Tata bụ ụbọchị iri abụọ na asatọ otu Nigeria Labour Congress (NLC) malitere abụbụ ọrụ na Naịjirịa gbaa gburugburu maka ụkwọ ọnwa opekatampe gọmentị jụrụ ibuliri ha.
Chete na gọmentị ekwebuola nkwa ibuliri ndị ọrụ oyibo ego opekatampe n'ọnwe Septemba, mana nke a agataghịzị ka ha sị kwuo.
Ya mere NLC jiri malite abụbụ ọrụ ịdọ aka na ntị ịzụụka abụọ.
Lee ka ihe siri kwụrụ na steeti nọ n'Igbo.
Abịa
Nwada Agaọdichimma bụ onye achọghị ka akpọruo aha ya n'isi gwara BBC Igbo na "ụlọọrụ nịle mechichere emechi nke bụ na "onweghị ihe gara aga n'Abịa steeti".
Ọ sị na kemgbe ụnyahụ n'ụlọakụ nile mechichere emechi.
Okwụkwara na ndị otu NLC na-agagharị ihu na ndị ọrụ nile ruwe isi na ya bụ abụbụ ọrụ.
Anambra
Onye ọrụ ọyibo BBC gbara ajụjụ ọnụ bụ Amaka Urigwe kwụrụ na "ebe nile dara jụụ site ụnyahụ bụ mkpụrụ ụbọchị iri na asaa n'ọnwa Septemba (27/09/18) bụ ụbọchị ya bụ abụbụ malitere n'Awka isi obodo Anambra steeti".
Ọ sị na agbanyeghị na ụfọdụ gara ọrụ ụnyahụ bụ Tọzdee "mana ọteghị aka ha lọhachi na be ha dị iche iche, " mgbe ndị otu NLC jị ụgbụala ha na-agagharị".
N'okwu ya, ka ọ dị tata, ndị ọrụ rubere isi na amụma abụbụ ọrụ a.
Ọ sịkwa n'ọtụtụ ụlọakwụkwọ mechiri emechi ọkachasị ndị nke gọmenti.
Ndị ọrụ ụlọakụ ụfọdụ mepere nwantakịrị ebe ụfọdụ mechichere kpam kpam site ụnyehụ rụọ tata.
Ebonyi
Ozị na-eru BBC ntị na-ekwụ na abụbụ ọrụ a dị ire na Ebonyi steeti nke bụ na ndị ọrụ oyibo agaghị ọrụ.
Ada Ominyi bụ ọnye lagoro ezumike nka na Ministri na-ahụ maka ahụike kwuru na ndị ụlọakụ nakwa ndị ahịa mmanụ ụgbọala azụghị ahịa tata.
Ọ sịkwa na ụmụakwụkwọ agaghị akwụkwụ tata maka na ndị nkuzi ha abịaghị.
Enugu
Ọtụtụ ndị ọrụ oyibo BBC gbara ajụjụ ọnụ n"Enugu kwuru na ya bụ abụbụ ọrụ adịchaghị ire na steeti ahụ.
N'okwu ha "gọmentị mụtara akwụghị ha ụgwọ ma ha gbaa abụbụ ọrụ".
Charity Eze bụ otu n'ime ndị ọrụ bekee anyị gbara ajụjụ kwụrụ na "gọmenti riri ụkwọ ọnwa m ugboro abụọ gara aga anyị gbara abụbụ ọrụ mana ndị otu NLC agbataghịrị m ọsọ enyemaka".
N'ihi ya ọtụtụ ndị ọrụ n'Enugu jụrụ isonye na abụbụ ọrụ ọbụla ebe ọbụ na a agbacha ya bụ egwụ ọ laa n'ụkwụ ha.
Ọ sịkwa na ya gara ọrụ tata rụe mgbe ndị otu NLC bịara chụpụwa mmadụ n'ụlọọrụ ha.
Charity kwukwere na ha ga-aga ọrụ ụbọchị Tuzde ma ọnweghị onye chụwara ha.
Imo
Onye nta akụkọ "Daily Sun" George Onyebuchi gwra BBC na ya bụ abụbụ ọrụ dị iri na Imo steeti nke bụ na ụlọọrụ nile mechiri emechi kemgbe ụnyahụ.
Okwuru na nke ka njọ bụ na ndị ọrụ ụlọakụ mechichere emechị nke bụ na ọtụtụ mmadụ ahụghị ego ha ji ebi ndụ.
Onyebuchi kwuru na ndị ọkwọọ ụgbala ụfọdụ apụtaghị nke mere na ndị pụtara tinye ego n'ihe eji eme njem.
Nke a mere ọtụtụ mmadụ jiri were ụkwụ na-agazịri onwe ha.
Onyebuchi sịrị na "ya gara ịwere ego n'ụlọ akụ asị ya n'ego adịghị".
Ọ bụ otu a ka ya bụ abụbụ ọrụ ndị NLC kpọrọ siri kwụrụ n'igbo nke tata.









