NLC si na ego nrite ndị omeiwu ga ebu Naịjirịa aka

Ebe foto si, Stringer
Nigeria Labour Congress ekwuola na nde naira 13.5 ndị omeiwu ukwu Naịjirịa na erị n'ọnwa a gaghị ekwe omume chacha.
Ọ bụ Shehu Sani na anọchite anya ndị Kaduna sentral na ogbakọ omeiwe ukwu gbara ama nrite a mgbe okwuru na ha na-eri nde naria 13.5 n'ọnwa, na-abụghị ụkwọ ọwa ha.
Odeakwụkwọ ndị NLC bụ Peter Ozo Esan, kwuru na ọ bụ ihe ihere na ọ na obodo ọpekatampe ndị ọrụ bụ 18,000 naira ka ndị omeiwu na-eri udị ego ahụ.
Ọ sịrị na ihe ọ jiri kwụọ otu a bụ na ọ ka na-ara ụfọdụ gọvanọ ahụ ịkwụ ya bụ ụgwọ ọpekatampe kemgbe e bidoro ya.
Shehu Sani si na ihe mere ha ejibeghị mee ihe gbasara nnukwu ego ahụ ha na-eri bụ maka na "a na-ezo ya ezo." Ọ sị na ya "kenere chukwu na ọ pụtala ihe ụgbụa agbanyeghị na ọ bụ ihe ihere".
Maazi Esan siri na ndị omeiwu ji ndị Naịjirịa na-ọrụ mere ha jị eri udị ego a ebe igwe mmadụ na-ata ahụhụ.
Ọ kwụkwara na ụgwọọnwa ndị ọrụ erụghị $50 ma agbanwoo ya ma ya fọdụzie ịzuru ha n'ọwa.
Ọ sịrị na ụfọdụ ndị ọrụ enweghị ike ịnye ezinaụlọ ha nrị ọnụ n'ọwa ebe ụfọdụ n'ime ha bụ ọgbenye ọnụntụ.
O kwuru na ọbụrụ na ndị omeiwu ga na-eri ụdị ụgwọ ahụ ha mara na a ga-etinyere ndị ọrụ ihe n'ụgwọ ọnwa.
Anyị ga eke nkwucha mara ihe anyị ga eme maka ya - Esan
Odeakwụkwọ ndị NLC siri na ha ga-akpakọ isi ọnụ mara ka a ga-esị kwọọ ya bụ onye ukwu wara.
Ọ sịrị na ọ dị mmkpa ịkwụsị ndị NASS ugbua maka ihe a maghị kwụrụ na Naịjirịa.
Peter kpọkụrụ ndị ọrụ ụdị okwu a dị na aka ka ha tinye anya na mmiri were chọwa ihe dabara mmiri iji mara ihe ha ga-eme ka-enwere webilata ego ole ndị ọrụ gọọmenti na-eri.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










