Gọọmentị agaghị akwụnwụ ụgwọ onwa ọhụrụ - NLC

Otu ndị ọrụ Naijiria

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị ọrụ Naijirịa na-ejị May 1 eme emume mba ụwa niile ji echeta ha.

Otu na-ahụ maka ndị ọrụ n'ala Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress na-eme mmemme eji mụpụta ha n'arọ 1978.

Maka ihe a, minista na-ahụ maka ọrụ aka na Naịjirịa bụ Chris Ngige ekwuola na gọọmentị na-akwado ị gbasa ozi gbasara ụgwọ ọnwa pekampe ọhụrụ na Naịjirịa.

N'oge gara aga, gọọmenti kwuru na ụgwọ ọnwa ọhụrụ nkea ga-abụ puku naira iri ise na isi.

Mana ndị ọrụ gọọmentị BBC kpọrọ n'elu ekwenti, ekwetaghị na gọọmentị ga-akwụ ugwọ nke a.

Akara ntụ-ntụ
Akara ntụ-ntụ

Gere ihe otu n'ime ha gwara anyị:

Aha onyonyo, Onye ọrụ Naịjirịa

Onye ọzọ n'ime ha na chọghị ka anyị deputa aha ya gwara onye nta akụkọ anyi na onweghị steeti gọọmentị nwere udi ego ahụ ị kwụ ndị ọrụ udị ụgwọ onwa ahụ

"Ha na-ekwu na ihe a bụ maka ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha nwee ike ị nweta ntụlị aka ndị mmadụ".

Onye ọrụ gọọmentị n'Imo steetị bụ Nzeocha Simeon kwuru na ya bụ ụgwọ ọnwa ọhụrụ a gaghị ezu onye ji ezinụlọ ka ya.

O na-ayo ka ego a bụrụ narị puku 100 maka ahụhụ na ọnọdụ obibi ndụ esiela ike.

Dr Achu Amadị bụ onye ọrụ gọọmenti lagoro ezumike nka kwuru na otu na-ekwuchitere ndị ọrụ na Naijirịa akpọrọ 'NLC' anaghị eme ọfụma.

Ọ sikwa na ha kwesiri ịhụ na ya bụ nkwa gọmmentị kwere maka ụgwọ ọnwa ọhụrụ bụ ihe biara na mmezu.

Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha ṅomie ndị ibe ha nọ na mba ọzọ n'ụzọ ziri ezi.