Ọrụ adịghi: Mmadụ nde narị asaa na ọkara enweghị ọrụ kemgbe 2016

Mgbe Muhammadu Buhari na-azọ ọchịchị, otu ịhe bụ okwu ọ kpụ n'ọnụ bụ nkwa ọ ekwere na ya ga enye ndị mmadụ ọrụ.
Okwu a Buhari kwuru na isi ndọrọndọrọ ọchịchị na 2015 bu ịhe eji kpụrụ ya na ọnụ ugbua, ọkachasị ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka ọnụ ọgụgụ a na-akpọ National Bureau of Statistics (NBS) nwepụtara ozi n'akọwa na mmadụ ruru nde asaa na nari ise so na ndị enweghi ọrụ kemgbe afọ 2016.
NBS kwuru nke a na akwụkwọ ọ kpọrọ "Labour Force Statistics Vol. 2: Employment by Sector Report,".
E wepụtara akwụkwọ a na Abuja n'ụka a gara aga.
Ke ihe ozi a pụtara?
BBC Igbo jụrụ Cheta Nwanze, bụ onye na arụ na SB Morgen bụ ụlọ ọrụ aka ha dị na nkọwa otu ịhe sịrị dị. Cheta gwara anyị na ihe dị na ọrụ nkọwa ihe ọgụgụ na enwe otu ọ dị, mana ọ sị na nnụkwụ ịhe mere na ụlọ ọrụ dị ichiche na Naịjịra n'ime afọ abuo gara aga.
"Achụrụ nwunye m na ọrụ mgbe Naịjirịa na ndị MTN nwere nsogbụ ọ were metụta ebe o na aru ọrụ. Okwu MTN ahu metutakwara ọtụtụ ụlọ ọrụ ha na ha na arụkọ ọrụ ka MTN ekweghị inye ha contract. A mam ọtụtụ ndị mmadu na arụbụ ọrụ na Proctor and Gamble, mana achụkwara ha n'ọrụ mgbe ụlọ ọrụ ahụ chụrụ oke anọ ndi ọrụ ha. Yabu ịhe metutara ọtụtụ mmadu," Ka Cheta Nwanze siri kwu.

BBC Igbo juru Nwanze maka okwu ndị gọọmenti Naịjirịa na ekwu banyere imepụta ọrụ.
Ọ sị na "nchọpụta ndị NBS na-akowa na ọrụ mmepụta mmanụ agbịdị agaghị n'ihu ka ọ sị kwesi. Nke a na egosị na agbaneghi na ego batara na ọrụ gbasatara mmanụ agbịdị, madụ ole ka ana ewo na ọrụ na mpaghara a? Mgbe e mere mgbakọ, ị ga ahụ na ịhe sirị ike ọfụma"
BBC Igbo kpọrọ ndị na-ekwuchịtere gọọmenti Naịjirịa ka ha kwuo uche ha banyere ịhe a NBS wepụtara mana onweghị onye zara n'ime ha.
Mana, gọọmentị Buhari weputara N-POWER, School Feeding Programme na ndị ọzọ dị na ime ịhe ha kpọrọ 'Social Empowerment Programmes' ha sị na ha ga ejị nyere ndị mmadụ aka na Naịjirịa.









