Ego ole ka ndị ụlọikpe na-eri?

Ndị Sineti

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Shehu Sani na-anọchi ndị Kaduna na sineti

Onye sinetọ na-anọchite ndị Kaduna Sentraal bụ Shehu Sani ekwupụtala na a na-akwụ ha ihe ruru ego nde naịra 13.5 kwa ọnwa ha ji arụ ọrụ.

Mana Sani kwuru na ego ahụ agunyeghị puku narị naịra asaa bụ ụgwọ ọnwa a na-akwụ ha.

O kwuru na a kpọghị ego ahụ aha mana e nyere ha iwu iweta akwụkwọ ego ọbụla ha mefuru si n'ọnụ ego nde naịra 13.5 ahụ.

Nke a ebutela akụkọ n'akụkụ dị iche iche dịka ndị mmadụ na-ekwu na ego ahụ karịrị akarị.

Otu sinetọ Naịjirịa na-erite ihe ruru nde 156 kwa afọ.

Ọ bụrụ na ị na-erite ụgwọọnwa ọpekata mpe (₦18,000):

  • Ọ ga-ewe otu sinetọ otu elekere na otu nkeji iji rite ụgwọọnwa gị.
  • N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 722 na ọnwa atọ iji rite ụgwọọnwa onye sinetọ na-erite kwa afọ.
  • Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1296, ị gaara enwe ike ịchụkwudo ha ugbua.
  • Ụgwọọnwa otu sinetọ ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu otu akpa osikapa.

Ọ bụrụ na ị na-erite ₦50,000:

  • Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere abụọ na nkeji 49 iji rite ụgwọọnwa gị.
  • N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 260 iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ na-eri kwa afọ.
  • Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1758, ị gaara enwe ike ịchụkwudo ha ugbua.
  • Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa atọ

Ọ bụrụ na ị na-erite ₦100,000:

  • Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere ise na nkeji 37 iji rite ụgwọọnwa gị.
  • N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 130 iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ kwa afọ.
  • Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1888, ị gaara achụkwudo ha ugbua.
  • Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa isii

Ọ bụrụ na ị na-erite ₦150,000:

  • Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere asatọ na nkeji 26 iji rite ụgwọọnwa gị.
  • N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 86 na ọnwa asatọ iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ kwa afọ.
  • Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1931 ị gaara emechawala, ị gaara achụkwudo ha ugbua.
  • Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa iri.

Ọ bụrụ na ị na-erite ₦200,000:

  • Ọ ga-ewe otu sinetọ elekere 11 na nkeji 14 iji rite ụgwọọnwa gị.
  • N'ụgwọọnwa gị ugbua, ọ ga-ewe gị ihe ruru afọ 65 iji rite ụgwọọnwa otu sinetọ kwa afọ.
  • Ọ bụrụ na ị bidoro ịrụ ọrụ n'afọ 1953 ị gaara emechawala, ị gaara achụkwudo ha ugbua.
  • Ụgwọọnwa otu sinetọ n'ime otu ọnwa ga-azụtanwu akpa osikapa 866, ebe ụgwọọnwa gị ga-azụtanwu akpa osikapa 13.

Kedụ etu ị ga-esi tunyere ha?

Biko tinye ụgwọọnwa gị
Ihe nkọwa ọbụla itinyere ga-anọ na kọmputa gị. BBC agaghị ewere ya, agaghị edokwa ya maọbụ kesaa ya

gị ụbọchị 30

Kekọrịta ihe pụtara

News image

Kekọrịta ihe pụtara

Kekọrịta ihe pụtara

kamgbe ị nọ na peeji a

Ị rittela:

onye mere ya

Olawale Malomo mepụtara nke a ebe Manuella Bonomi mere eserese ya

Etu e si eme ya

Ihe e ji mee atụmatụ ụgwọọnwa ndị sinetọ sitere n'okwu Sinetọ Shehu Sani kwuru, bụ otu n'ime ndị sineeti Naịjirịa n'ụbọchị Maachị 7, 2018. Ego ole ndị sinetọ na-eri n'ụgwọọnwa adịghị n'ebe ọha na-ahụ ya anya ugbua.

N'ụbọchị Maachị 20 2018 e jiri http://xe.com gbanwee ego n'ọnụ 1USD=359.200NGN, , 1GBP = 503.483NGN

Ihe mgbakọ were ya na otu akpa osikapa ga-abụ ₦15,000

Kekọrịta peeji a

Kekọrịta peeji a

Ndị otu na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Nigeria Labour Congress (NLC) na bekee kwuru na ego ahụ karịrị akarị, ebe ego ekewapụtara maka ndị ọrụ bụ naanị puku naịra iri na asatọ (N18,000).

Fidelis Edeh bubu osote onyeisi ndị NLC kwuru na ọnọdụ a bụ ihe na-agba anya mmiri maka na ọ dịka ka ha a nọrọ onwe ha.

N'okwu ya: "Nke a o kwukwara abụghị ebe ahụ ka o bere, a na-akwụkwa ha ego iji rụọ ọrụ maka ndị ha na-anọchite.

"Mana onye ọbụla makwa na ọ bụ ha na-ahazi etu a ga-esi mee ya mana ị ga nime obodo ebe ha kwesiri ịrụ ọrụ ahụ, onweghi ihe ị ga-ahụ."

Ọtụtụ ndị mmadụ na-etinye ọnụ n'okwu a kwuru na ndị sinetọ anaghị etinye uche na iwelite ego ụgwọ ndị ọrụ mana ọ bụ naanị onwe ha ka ha na-elegara anya.

Ndị lara ezumike nka

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị lagoro ezumike nka emela ngagharị iwe ọtụtụ oge maka ego a na-akwụbeghi ha

I mara ego ole a na-akwụ ndị ọchịchị Naịjirịa?

Edemede a si n'aka ndị RMAFC- http://www.rmafc.gov.ng/

Ilebe anya na mpaghara mba ụwa ndị ọzọ, Naịjiria na-emefu ego n'ọchịchị karịa mba ụwa ndị ọzọ ọbụla.

Ndị na-eme njegharị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị NLC emela njegharị iwe ọtụtụ oge maka ụdị ego a na-akwụ ndị ọrụ

Otela ndị mmadụ na-ajụ ego ole a na-akwụ ndị ọchịchị mana, ngosipụta sinetọ Sani ekpughele ihe ezoro ezo.

Ego ole ka mba ndị ọzọ na-emefu n'ọchịchị?

Edemede a si: Arabian Journal of Business and Management Review(OMAN Chapter) Vol. 4, No.5: December 2015.

Nke a gosiri na Naịjiria kacha mba ndị ọzọ niile n'ụwa akwụ ndị ọchịchị ụgwọ ọnwa.

Ọnọdụ a adịghịkwa ọtụtụ ndị Naịjiria mma n'obi.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ