Kedụ ngalaba uweojii bụ 'Tiger base' na ihe mere ndị mmadụ ji akpọ oku ka e mechie ha

Ndị uweojii ngalaba Tiger base nọ n'ọrụ na njirimaara ha.

Ebe foto si, Imo State Police Command/X

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị ụweojii na-arụ ọrụ na ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti a na-akpọ 'Tiger base' abụrụla ndị a kpụ n'ọnụ ugbua, ọkachasị n'ịntanet.

Ọtụtụ ndị mmadụ, ọkachasị ndị bi na gburu gburu Imo Steeti akatọọla ihe ha kpọrọ akaike ndị uweojii nọ na ngalaba ahụ ji arụ, nke mere ha jiri akpọ oku ka e mechie ngalaba ahụ.

Aha 'Tiger base' malitere ifesa na soshal midia kamgbe izuụka gara aga dịka ndị mmadụ n'ebubo ndị uweojii a ebubo dị iche iche.

Nke a mere ka isiụlọọrụ ndị uweojii n'Imo jiri wepụta ozi iji zaghachị ihe a ndị mmadụ na-ekwu maka ngalaba Tiger base.

N'akụkọ a, BBC Igbo lebara anya na ndị bụ uweojii ngalaba Tiger base, ụfọdụ ebubo e boro ha nakwa ihe isiụlọọrụ uweojii Imo steeti kwuru na nzaghachị ebubo ndị ahụ.

Kedụ ndị bụ ndị 'Tiger base'?

Ndị uweojii (Tiger base) n'Imo steeti.

Ebe foto si, Imo state police command / X

Tiger base bụ ngalaba ụlọọrụ ndị uweojii na-ebuagha megide ntọrị mmadụ na ndị ojiegbe ezu ohi dị iche iche a kpọrọ 'anti-kidnapping squad'.

Ha na-arụ ọrụ n'ebe dị iche iche n'Imo Steeti na gburu gburu ya, ma nọrọkwara n'okpuru isiụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steet.

Ọrụ ha gunyere ibuso ndị ohi agha, ndị ojiegbe, ndị otu nzuzo, nakwa ndị omekome ndị ọzọ.

Ọzọ bụ ime ka ezi nchekwa na udo dịrị n'Imo steeti site na i jide ndị omekome.

Mana etu e si amara ndị ọrụ uweojii Tiger base gunyere udiri uwe ha na-eyi nakwa ekike ndị ọzọ ha na-eke.

Uwe ha dịka ọtụtụ ndị mmadụ si kwuo na-atụ egwu.

Ha na-eyi uweojii gbadara ala, jiri uwe ọbala ọbala kee n'isi egbe ha ma na-ekpuchi isi ha.

Ekike ha dị iche na ikike ndị uweojii a maama.

Kedụ ebe a na-ebu ndị 'Tiger base'?

Ebubo a na-ebo ndị uweojii nap-aru ọrụ na Tiger base gunyere:

  • Iti mmadụ ihe nke ukwuu
  • Ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ
  • Igbu ndị mmadụ n'ụzọ iwu akwadoghị
  • Ịnapụ ndị mmadụ ego n'ike
  • Imanye ndị ha jidere ka ha kwete na ha mere ihe ha na-emeghị
  • Ime ka mmadụ fuo
  • Itinye ndị ndị mmadụ n'ụlọ mkpọrọ adịgboroja
  • Ntọrị na ajọ ihe ndị ọzọ

Ihe ndị ọzọ a na-ekwu maka ndị ọrụ Tiger base gụnyere; na ha na-arụrụ ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọrụ ma na-enweta nkwado n'aka ndị ha na-arụrụ ọrụ ndị ahụ.

Ihe ndị uweojii sara banyere ebubo ndị a

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Okoye Henry

Ebe foto si, Imo state police command / X

Nkọwa foto, Okoye Henry
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Isiụlọọrụ ndị uweojii n'Imo steeti kwuru na ebubo niile e boro ndị ọrụ Tiger base abụghị eziokwu maka na enweghị ihe akaebe tọrọ atọ kwadoro ebubo ahụ niile.

Ha mere ka a mata nke a n'ozi ha wepụtara na Disemba 3, 2025 nke ọnụ na-ekwuru ha bụ Okoye Henry binyere aka na ya.

N'akwụkwọ ozi ahụ, ndị uweojii na-ekwu na ndị ọrụ 'Tiger base' na-eme ihe niile ha na-eme n'usoro iwu Naịjirịa.

Ha gara n'ihu katọọ etu ndị mmadụ si na-achọ itinye ịkpaoke agbụrụ maka na onyeisi ndị ọrụ 'Tiger Base' abụghị onye agbụrụ ha ma kwuo onye ọbụla bụ onye uweojii nwere ikike ịrụ ọrụ na mpaghara Naịjirịa niile.

N'okwu ha "ndị ọrụ Tiger Base na ndị ọrụ nchekwa dị icheiche na-ejikọ aka ọnụ arụ ọrụ ma na-arụ ya n'usoro nakwa etu doro anya".

Mana Onyeisi ndị uweojii n'Imo steeti bụ Aboki Danjuma enyela iwu ka e guzobe ngalaba ga-ahụ maka ikike dịrị mmadụ n'ime ụlọọrụ 'Tiger Base'.

Aboki Danjuma gara n'ihe gwa ndị Imo steeti ka ha hara ige ndị na-ebo ndị ọrụ Tiger Base ebubo ntị ma gwa ha gaa tinye mkpesa ha na ngalaba Complaints Response Unit (CRU), XSquad, maọbụ nae Human Rights Desk Unit dị n'ime Tiger base.

Ha dọrọ aka na ntị na ndị niile na-ekesa ozi ma na-ebo ndị ọrụ Tiger base ebubo na-ada iwu nke Cybercrime Prohibition Act 2015.

Cheta na ọ bụ etu a ka e si bido ịkpọ oku ka a kwụsị ọrụ ngalaba ndị uweojii a na-akpo Special Anti Robbery Squad (SARs) nke e jiri #EndSars mara n'afọ 2020.

Ugbu a n'Imo steeti, ọtụtụ ndị mmadụ ji soshal midia ha na-akatọ ọrụ ndị 'Tiger Base' ma na-ebo ha ebubo dị icheiche bụ nke ndị uweojii kwuru na-enweghị ihe akaebe kwadoro ebubo ndị ahụ.