Etu ndị ntọrị si gbochie ndị na-eme njem Ekeresimesi n'ụzọ Ugwogo-Opi-Nsukka

Aha onyonyo, Ihe anyị chọpụtara gbasara ebubo mkpa mkpa ndị ntọrị n'ụzọ Ugwogo Opi-Nsukka
Etu ndị ntọrị si gbochie ndị na-eme njem Ekeresimesi n'ụzọ Ugwogo-Opi-Nsukka
Ụgbọala abụọ na-agba n'okporoụzọ Ugwo/Opi/Nsukka

Dịka mmemme Ekeresimesi tinyegoro ụkwụ ugbua, ọtụtụ mmadụ n'eme njem gaa obodo ha ịgba ya bụ mmemme.

Ụfọdụ ndị njem sị Enugwu eme njem n'ụzọ Ugwogo Nike Opi Nsukka gbara ọsọndụ n'ubọchị Sọnde 21 Disemba 2025 n'ihi mwakpo ndị ntọrị mere n'ụzọ ahụ.

Otu ihe onyonyo fegharịrị na soshal midia gosiri ndị a na-eche bụ ndị ntọrị ka ha buuru ụfọdụ ndị mmadụ na-aga n'Api Opi, nke mere ndị njem jiri gbaa ọsọ ma lọghachịte azụ.

Ihe onyonyo ahụ gosiri nwaanyị bu ndị ezinaụlọ na-aga njem, mana ngwa ngwa ọ hụrụ na ndị ọzọ -agba ọsọ, o mere ngwa ngwa tụgharịa ụgbọala ma laghachi n'Enugwu.

BBC Igbo gara n'ọdọụgbọala a kpọrọ 'Liberty nke dị n'Abakpa Enugwu, ebe ọtụtụ ụgbọala na-agba n'okporoụzọ Ugwuogo/Opi/Nsukka si amalite njem ha.

Maazị Okechukwu Atanyi bụ onyeisi ọdọụgbọala ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ gbara ọsọ n'okporoụzọ Ugwogo n'ụbọchị Sọnde kama na ha amabeghi ma o nwere onye a tọọrọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe kwuru na ha na-eleba anya n'ihe mere n'okporoụzọ ahụ, na ngwa ngwa ha nwetere ozi banyere ya na ha ga-eme ka ọha maara.

Ụgbọala na-acha ntụntụ na-agba n'okporoụzọ dị n'Enugwu Steeti

Cheta na nke a abụghị mbụ a na-anụ akụkọ banyere etu ndị ntọrị si akpa ikpe na-atọ ndị mmadụ n'okporoụzọ Ugwogo/Opi/Nsukka.

Na nso nso a, n'ọnwa ndị emba a, ndị ntọrị a malitere ịkpa ike dị ukwuu n'ụzọ ahụ mana Gọọmenti Enugwu steeti kwuru na ha ehiwela ọnọdụ ndị nchekwa n'uzọ ahụ.

Ha gara n'izu zụta ụgbọelu 'drone' nke a sị na-enye aka ịchọpụ ebe ndị ntọrị a weere ọnọdụ n'ime ọhịa dị iche iche na steeti ahụ.

N'otu aka ahụ, ndị uweojii kwuru na ha ejidela ọtụtụ ndị omekome na-atọrọ ma na-egbusi ndị mmadụn n'ụzọ ahụ.

Otu onye ọkwọ ụgbọala gwara BBC okwu bụ Ambrose Okeke rịọrọ gọọmenti Enugwu Steeti ka a gbatara ha ọsọ enyemaka ọkachasi n'oge Ekeresimesi a.

Okporoụzọ gbara chakọọ na o nweghi ụgbọala na-agba maọbụ mmadụ na-aga ije n'elu ya.

Mgbe ndị uweojii bara n'ọhịa Ngo Okpala ịnapụta ndị a tọọrọ Imo Steeti

Ndị uweojii abaala ọhịa iji napụta ndị a tọọrọ na Ngor Okpala, Imo Steeti

Ebe foto si, Imo State Police Command

Kọmịshọna ndị uweojii n'Imo Steeti bụ Aboki Danjuma ehiwela atụmatụ kpụ ọkụ n'ọnụ, nke ya na ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ na ndị nche obodo ga-eji gbakọta aka n'ọrụ.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Imo Steeti bụ Henry Okoye wepụtara n'ụbọchị Mọnde 8 Disemba 2025, o kwuru na nke a bụ iji nwuchie ndị aka ha dị na mwakpo e mere ndị njem n'obodo Amala dị na Ngor Okpala n'ụbọchị Sọnde 7 Disemba, 2025 ma napụtakwa ndị ha tọọrọ.

Okoye kwuru na nnyocha ndị uweojii merela ugbua gosiri na ndị omekome si n'ọhịa pụta mgbe ọ fọdụrụ ihe dịka nkeji iri ka ọ kụọ elekere asatọ nke abalị, gbaa ọkwọụgbọala Toyota Highlander akara njirimara ya bụ SMK514BD egbe, ma tọrọkwa ndị nọ n'ime ụgbọala Lexus RS300 akara njirimara ya bụ FSD334XA.

"Oge anyị natara ozi a, ndị uweojii si n'ụlọọrụ anyị nọ na Ngor Okpala gbapụrụ ọsọ gaa n'ogbe ahụ, chekwaa ya ma bugaa ọkwọụgbọala ahụ ụlọọgwụ, bụ ebe a nọọrọ kwuputa na ọ nwụọla," ka Okoye kwuru.

Ozi ahụ gara n'ihu kwuo na ndị nchekwa amalitela ipiogharị ọhịa niile dị n'obodo Amala Ngor Okpala iji napụta ndị a tọọrọ, ma nwuchie ndị mere arụ ahụ.

Ndị uweojii achọpụtala ogige ndị omekome na ndị ntọ dị n'Imo Steeti

Kọmishọna ndị uweojii Imo Steeti na ndị ọzọ so oge ha mere nchọpụta ahụ.

Na mbọ ha na-agba iji chụọ ndị omekome ọsọ ụkwụ eru ala n'imo Steeti, ndị uweojii achọpụtala ogige ndị ntọ dị n'obodo Umuhu dị na Ngor-Okpala.

E kwuru na ọ bụ ogige ahụ ka ndị omekome na-awakpo ma tọrọ ndị mmadụ n'okporoụzọ Owerri-Aba Express.

Ndị so mee nchọpụta ahụ e mere n'ụbọchị Satọde 6 Disemba, 2025, gụnyere kọmishona ndị uweojii steeti ahụ bụ Aboki Danjuma, kọmishọna ahụike bụ Chioma Egu, ndị ọrụ nchekwa Ngor-Okpala Vigilante group nke Henry Ikpe nọ n'isi ya, onyeisioche okpuru ọchịchị Ngor-Okpala bụ Chika Ibekwe nakwa ọtụtụ ndị ọzọ.

Akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Henry Okoye kwuru na ha na-achọ otu onye aha ya bụ Stanley Morocco Oparaugo e kwuru na ọ bụ ya nwe ogige ahụ.

Ozu ndị mmadụ a dị n'ọba ozu ahụ ndị uweojii chọpụtara

Henry Okoye kwuru na ha chọpụtara ụlọ oriri na nkwari nakwa ụlọ ọba ozu e kwuru na ọ bụ Stanley Oparaugo ya. E kwuru na ọ bụ ebe ahụ ka ndị omekome na-anọ akpa mkpa ha na steeti ahụ.

A chọpụtara ọtụtụ ozu ndị mmadụ e bepụrụ ụfọdụ anụ ahụ ha nke ndị uweojii kwuru na ọ dị ka ha na-atụ mgbere anụ ahụ ndị mmadụ.

Ndị uweojii machiri ogige ụlọ oriri na nkwari ahụ nakwa ọba ozu ahụ. ndị uweojii gakwara nyochaa ụlọ obibi Stanley ma chọpụta ụfọdụ ihe akaebe dị iche iche.

Kọmishọna Aboki Danjuma kwere nkwa na ndị ọrụ ya ga-anwụchi nwaamadị ahụ ma kwuo na ọ bụ onye a na-achọ ugbua. Ọ gwara onye ọbụla nwere ozi ga-enyere ndị uweojii inwụchi ya, ka onye dị etu a kpọtụrụ ụlọ ndị uweojii ọbụla dị ya nso maọbụ ọ kpọọ akara ekwenti a 08034773600.

Ka ọ dị ndị uweojii etinyela ndị ọrụ n'okporoụzọ Owerri-Aba iji hụ na e nwere ezi nchekwa n'ụzọ ahụ.

Ndị uweojii oge ha mere nchọpụta ahụ.

Ihe anyị chọpụtara gbasara ebubo mkpa mkpa ndị ntọrị n'ụzọ Ugwogo Opi-Nsukka

Ndi njem si ụzọ Ugwogo dị n'Enugwu na-aga Nsukka nakwa Abuja na-achịzi obi ha n'aka maka akụkọ na-efegharị na soshal midịa na ndị ntọrị mmadụ na-awakpo ọtụtụ ndị njem n'ụzọ ahụ.

Dịka akụkọ na-efegharị na soshal midịa siri kwuo, ndị ntọrị na-eburu ndị mmadụ banye n'ime ọhịa n'ụzọ Ugwogo Opi-Nsukka kemgbe mkpụrụ ụbọchị atọ ugbua.

Akụkọ kwuru na ndị ntọrị weere ọnọdụ ebe ahụ ma na-akpa ike nke mere ndị njem jiri kwụsị ụgbọala n'okporoụzọ.

Ọ bụ ihe anyammiri ịhụ onyonyoo ndị mmadụ tinyere na soshal midịa ebe ndị njem si Enugwu na-aga Nsukka nakwa Abuja na-agbaghachi azụ n'okporoụzọ Ugwogo n'ihi na ndị ntọrị nọ ha n'ihu akpa ike.

Ụzọ Ugwogo Opi-Nsukka bụ ụzọ si Enugwu gawa Nsụka nakwa Abuja.

Kemgbe abalị anọ, ya bụ ụzọ bụzi ebe ndị ntọrị na ndị ala adịghị mma ji mere ọnọdụ.

Akụkọ kwuru na ndị ntọrị weere ọnọdụ ebe ahụ ma na-akpa ike nke mere ndị njem jiri kwụsị ụgbọala n'okporoụzọ.

Ebe foto si, Screenshot/Facebook

Nkọwa foto, Ndị njem kwụsịrị ụgbọala ahụ n'okporoụzọ

Ihe ndị hụrụ ihe merenụ kwuru

Dika otu nwoke aha ya bụ Samuel Ede mere njem gaa Nsụka n'ụbọchi Tuzde 2 Disemba, 2025 siri gwa anyị:

"Abanyere m ụgbọala Sienna na Liberty dị n'Abakpa na-aga Ubollo. Mgbe anyị gafechara ebe ndị uweojii na-eme nnyocha na-erute abe arụsi "Api Opi" anyị hụrụ ndị ọzọ ka ha ji ọsọ agbaghachi azụ. Ụgbọala anyị tụgharịrị ma gbawa ọsọ."

"Ọtụtụ ụgbọala chere ruo ihe dịka ọkara awa tupu ndị uweojii abịa gafee, sị anyị gawazie. Anyị hụrụ ụgbọala abụọ n'okporoụzọ, mana a tọrọla ndị nọ n'ime ha."

Onye ọzọ kwukwara na ndị ntọrị ahụ wakporo otu ụgbọala n'Ugwogo n'ubọchị Mọnde 1 Disemba, 2025 n'oge ehihe, na mpaghara dị nso na Mahadum Peace University.

Nchọpụta gosikwara na ha buuru ndị njem nọ n'ime ụgbọala ahụ.

Mgbe anyị gara n'ogige ụgbọala ndị njem na-aga Nsụka nakwa Abuja dị na Liberty Abakpa, onye ọkwọụgbọala bọọsụ gwara anyị na ha na-achịzi obi ha n'aka ụbọchị niile n'ihi na ha amaghị ma ndị ntọrị ọ nọ n'okporoụzọ.

Ndị ọkwọụgbọala ahụ kpọrọ oku ka gọọmenti kpọọ ya mkpa ma jide ndị ọjọọ na-akpa mkpamkpa ahụ n'okporoụzọ.

Maazị Daniel Ekwenugo kwuru sị: "Ka m gwa gị eziokwu, ha tọọrọ mmadụ n'ụbọchi Mọnde 1 Disemba, tọrọ n'ụbọchị Tuzde 2 Disemba, ma tọrọkwa ndị mmadụ n'ụbọchị Wenezde 3 Disemba. Gwa m ihe mere na gọọmenti enweghị ike ijide ha?"

O kwukwara na ọ dị ka ndị ntọrị mmadụ na-amazi gọọmenti aka n'ihu.

Kedụ ihe ndị uweojii kwuru?

BBC jụrụ ndị uweojii Enugwu steeti ihe ha nwere ikwu maka akụkọ a, mana ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe azaghị ya bụ ajụjụ.

Anyị gakwara n'ihu gbaa Gọọmenti Enugwu ajụjụ maka nke a, mana ha azaghị ajụjụ ahụ.

N'oge gara aga, a tọọrọ otu onye bụbu odeakwụkwọ Gọọmenti Enugwu steeti bụ Maazị Dan Sheere n'ụzọ ahụ ma napụ ya ihe ruru nde naịra iri ise (N50m) tupu a tọhapụ ya.

Kwa mgbe kwa mgbe ka ndị uweojii Enugwu na-ewepụta ozi iji gosi na a na-atọkarị mmadụ ebe ahụ. Ha na-egosikwa ndị ha zọpụtara n'ime ọhịa.

Ka ọ dị igbua, ndị njem si Ugwogo na-aga Nsụka maọbụ Abuja na-achịzi obi n'aka.