Kedụ ihe mere Trump ji nye Naijiria na mba 23 ndị ọzọ mmachi visa?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ebubo mmekpa ahụ ndị ụka Kraistị ọkachasị n'Ugwu Naijiria, Gọọmentị Amerịka amachịela Naijiria n amba 23 ndị ọzọ ịbata ala ha.
Ozi si na Gọọmentị Amerịka ụbọchị Tuzde kwuru na a machiri bụ maka ihe dị iche iche.
Na nsonso a Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald trump majara sị na ya ga-ezite ndagha Amerịka ịbịa ọgụ megide iyi ọha egwu ma ọ bụrụ na Gọọmentị Naijiria emeghị ngwa kwụsị nsogbu enweghị nchekwa na mkpagbu ndị ụka Kraịstị.
Mana Gọọmentị Naijiria gọrọ sị na -anaghị akpagbu ndị Ụka Kraistị, kama na ntọ na ogbugbu mmadụ na emetụta oke na ọgịnị na-agbanyeghị agbụrụ maọbụ okpukperechi onye.
Gịnị mere Trump ji tinye mmachị Visa a?
Ihe Gọọmentị Amerịka kwuru mere ha ji tinye Mmachi ịbata ala ha gụnyere:
Nsogbu Boko Haram:
Ozi si n'Aka Gọọmentị Amerịka kwuru na mkpamkpa nke out Boko Haram nakwa Iswap bụ ndị na-akpa mkpamkpa n'ebe dị iche iche na Naijiria ka o si masị ha.mere
Ndị na-anọfe oge e nyere ha:
Ozi ahụ kwụkwara na ụfọdụ ji akwụkwọ ikike ịnọ nwa mgbe nta na-ekwechiri nọrọ gafee oge e Nyere ha.
Ihe dịka pasent 5.56 ndị nwere akwụkwọ ikike 'B-1/B-2 visa' na-anọfe oge e Nyere ha, ebe pasent 11.90 ndị nwere F, M, and J visa na-anọ na-eneghị ikike.
Nsogbu ịma onye bụ onye:
Ọzọ bụ na Gọọmentị Amerịka kwuru na nsogbu nchekwa na-ebute igbu oge na ịmata ndị bụ ụmmụamala, nke bụ ndị mbịarambịara butere nakwa ndị na-abịa maka ọrụ.
Ya mere, Gọọmentị Amerịka ji kwuo na ha ga-akwụsị inye ndị chọrọ ịgbata ala ha ọsọ ndụ akwụkwọ ikike ime nke a,ma kpachikwa ndị mbịara mbịara ndị ọzọ.
Kedụ ndị mmachị a ga-emetụta?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Gọọmentị Amerịka kwuru ndị a machiiri ịbata site n'ụdị akwụkwọ ikike mbata e nyere ha:
Ndị bịara ije nwa mgbe nta- nke gụnyere ndị njem nlegharị anya, ndị ọrụ nwa mgbe nta nakwa ndị bịara maka azụmahịa
Ndịị bịambiri- Ndị mbịarambịara chọ®ọ ka ha na ezinaụlọ ha bịa biri ma rụwa ọrụ n'Amerịka
Ụdị 'Visa Amerịka machiri maka ndị si Naijiria gụnyere:
B-1: Nke a bụ akwụkwọ ikike nwa mgbe nta nke Amerịka na-enye maka ndị na-abịa maka azụmahịa,aagụmakwụkwọ , ọrụngo maọbụ onye si Amerịka agaje mba ọzọ. Akwụkwọ ikike ha ga-abụ naanị ọnwa isii mana e nwere ike ịgbatị ya rue out afọ.
B 2: Nke a yiri akwụkwọ nke B-1, mana ọ bụ maka ndị na-abịa ezumike maọbụ onye ezinaụlọ maọbụ enyị maọbụ onye na-abịa maka nleta ahụike. Oge ya dịkakwa ka nke mbụ.
F visa: F-1 nke a bụ akwụkwọ ikike maka nwatakwụkwọ bịara ịgụ kọleg maọbụ mahadum mana onye ahụ ga-enwe ohere ịnọ abalị 30 tupu ọ malite agụmakwụkwọ ya ma nwee ohere abalị 60 o jiri gụchaa.
M-1: Nke abụ akwụkwọ maka ụmụakwụkwọ ndị na-amụ aka, ha nwere ohere abalị 30 tupu ha-ebido nakwa abalị 30 ma ha gụchaa.
J – Nke abụ akwụkwọ ikike pụrụ iche maka ndị bịara Amerịka nkụzị, nnyocha mabụ ọmụmụ n'ihe gbasara ahụike nke a kpọrọ 'exchange visitor' na Bekee.
Akwụkwọ ikike na-abụkarị maka oge onye ahụ ga-anọ. Ọ bụrụ na a gbatịaoge ọrụ ahụ, onye ahụ nwere ohere ịnọkwu mana ọ gaghị anọkarị abalị 30 tupu ọrụ amalite nakwa abalị 30 ọrụ ahụ ji gwụ
Amerịka machiri ndị Nijie nile ịbata
Abịa n'okwu mba Nijie, Gọọmentị Amerịka kwuru na ha chọpụtara na 'ndị oyi ọha egwu na ndị nkwado ha na-eme ntọ agha aghara na Nijie ma na-eme mwakpo n'ebe ọbụla masịrị ha n amba ha ka o si masị ha."
Mba ndị a machiri ụmụamaala ha ịbata Amerịka:
- Afghanistan
- Bọkina Faso
- Chad
- Ekwuitorial Gini
- Eritria
- Heiti
- Iran
- Laos
- Libya
- Mali
- Nijie
- Kongo
- Siera Lionu
- Somalia
- Saụt Sudan
- Sudan
- Syria
- Yemen
Mba ndị a machiri ndị e nwere pati a machiri
- Angola
- Antigua and Barbuda
- Bene
- Burundi
- Ivori Kostu
- Kuba
- Dominika
- Gabon
- Gambia
- Malawi
- Mauritania
- Naijiria
- Senegal
- Tanzania
- Togo
- Tonga
- Venezuela
- Zambia
- Zimbabwe
Ugboro atọ Trump na-etinye mmachi
Nke a bụ nke ugboro atọ Donald Trump na-etinye Mmachi maọbụ mkpachi ikike ịbata Amerịka
Oge ọ chịburu agba nke mbụ ya, ọ mara ọkwa n'afọ 2017 na ụfọdụ mba agaghị abata Amerịka.
O kwuru na Mmachi ahụ ga-adịgide rue ma e nwere ' na nkwado na mba ndị ahụ ọganihu'
N'ọnwa Julai, Trump machiri mba 12 ma kpachie nje mba asaa.
N'ozi nke Gọọmentị Amerịka wepụtara, Trump binyere aka ka mmachi ahụ bụrụ iwu ọkachasị "maka mba ndị na-egbu oge ikwado Amerịka na mbọ ịhụ na ndị mbịarambịara anaghị awụjubata."
Kedụ ndị mba Amerịka ga-anapụ akwụkwọ njem 'visa' maka mkpagbu okpukperechi na Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Mba Amerịka ekwupụtala na ha ga-anapụ ọtụtụ ndị Naịjirịa akwụkwọ ikike 'visa'.
Nke a ga-emetụta ndị a na-ebo ebubo na ha na-akwado mkpagbu ndị okpukperechi na mba Naịjirịa.
Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio kwuru na Amerịka "na-eme ihe niile kwesịrị ekwesị iji buo agha megide mkpagbu na arụ ndị a na-emeso ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa nakwa gburugburu ụwa".
N'ozi o wepụtara n'akara ọbaozi X ya, Rubio sịrị: "Ngalaba Steeti ga-anapụ ndị na-akwado maọbụ na-emetọ ikike nnwerenweonwe nke okpukerechi akwụkwọ visa Amerịka ha".
Nkwupụta a bịara n'oge mba Amerịka na-akwanye Naịjirịa ọkụ n'ahụ n'ihi ebubo Onyeisiala Trump boro na a na-akpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst na Naịjirịa.
Na nso nso a ka Donald Trump kwupụtara Naịjirịa dịka mba e kwesịrị ilebara anya bụ Country of Particular Concern (CPC) n'asụsụ Bekee.
O kwuru na mba Amerịka "agaghị akwụrụ n'akụkụ dịka arụ ndị ahụ na-eme na Naịjirịa".
Kedụ ndị ọnọdụ a ga-emetụta?
Mpaghara iwu 212(a)(3)(c) nke US Immigration and Nationality Act nyere mba Amerịka ikike ịnapụ ndị aka ha dị na mkpagbu ndị na-eso ụzọ Kraịst akwụkwọ visa ha, tinyekwara nke ndị ezinaụlọ ha, ma ọ bụrụ na o kwesịrị.
Ọ bụrụ na e tinye atụmatụ a n'ọrụ, ọtụtụ ndị na-atụ anya na ọ ga-emetụta ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa, nke gụnyere:
- Ndị na-akpagbu ụmụ mmadụ n'ihi okpukperechi ha.
- Ndị ha na ndị na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi na-enwe mmekọ.
- Ndị na-enye ikike ka a kpagbuo mmadụ n'ihi okpukperechi na Naịjirịa.
- Ndị ji ego na-akwado ndị na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi na Naịjirịa.
- Ndị na-enyere ndị na-akpagbu mmadụ n'ihi okpukperechi aka.
- maọbụ ndị na-emebi iwu nwereonwe nke okpukperechi.
Olee ndị na-akwado mkpagbu ndị nke Kraịst na Naịjirịa?
Ka ọ dị ugbua, o nwebeghị onye a kpọrọ aha a na-enyo enyo na o so na ndị na-akwado iyi ọha egwu na Naịjirịa, dịka ọnọdụ nchekwa na-akawanye njọ na mba ahụ.
Mana, ụlọomeiwu Naịjirịa akpọọla oku ka gọọmenti kpọọ aha ndị na-akwado iyi ndụ egwu na Naịjirịa ma kpee ha ikpe.
Ụlọomeiwu Sịnetị na Ụlọomeiwu Nnọchiteanya Naịjirịa kpọrọ oku a n'ụbọchị Wenezde 3 Disemba 2025 oge ha na-enwe ọgbakọ, dịka ụzọ ha chọrọ ka e ji zute nsogbu enweghị nchekwa na-arị elu na mba ha.
Ụlọomeiwu Sịnetị kpọkwara oku ka e gbuo onye ọbụla a chọpụtara na ọ bụ onye ntọ, tinyere ndị ji ego na-akwado ha, ndị na-enyere ha aka nakwa ndị na-ewetara ha ozi.
Ugbua, a na-eche ka gọọmenti wepụta aha ndị a chọpụtara na ọ bụ ha na-akwado iyi ndụ egwu na ọnọdụ enweghị nchekwa dị na Naịjirịa.









