Kedụ ihe Naịjirịa merela iji gbanarị mmachi Trump?

Ebe foto si, Presidency/Getty
Na nsonso a, ọchịchị Onyeisiala Donald Trump nke Amerịka mara ọkwa na ha ga-etinye iwu n'ọrụ iji gbochie ụmụamala Naịjirịa, Gana, na mba iri atọ na anọ ndị ọzọ ịbata mba Amerịka, maọbụ ndị akwụkwọ njem ha zuru oke ịnọ Amerịka karịa abalị iri isii.
Atụmatụ ọhụrụ a maka njem bụ nke ha na-elebanye anya bụ iji hụ na Amerịka kere ajị n'ume n'okwu nchekwa ala ha.
Mba ndị o metụtara
Mba ndị mmachi ahụ nweere ike imetụta gụnyere Naijiria, Gana, Nijie, Senịgal, Bene, ,Bọkịna Faso, Kamerun, Ivori Kostu, Ijipt, Gabọn, Tanzania, Gambia, Itiopịa, Malawi, Liberia, Saụt-Sudan, Angola, Antigụa na Babuda, Butan, Kambodia, Kepu Vedi, DRC Kongo, Jibuti, Dominịca, Kyrgyzstan, Mọrichọs, Sentị Kits na Nevis, Sent Lucia, Sao Tome na Principe, Sirịa, TongaTuvalu, Yuganda, Vanuatu, Zambịa na Zimbabuwe.
Gịnị butere mmachi a a na-akwado?
Mmachi abalị 60 e nyere sitere na iwu ọchịchị nọ ugbua nyere maka ike nkwụcha ichekwasi ala ahụ ike nakwa imachi ndị mbiarambiara si mba a ma ama maka nsogbu ndekọ onye bụ onye mba ha si, ịnọfe karịa oge e nyere ha and iyi ndụ egwu.
E nyere gọọmentị mba ndị okwu a metụtara abalị 60 ka ha weta atụmatụ ihe na-akawado ime iji hụ na nsogbu ụmụamaala ha bi n'Amerịka enweghị akwụkwọ.
Nke a pụtakwara na oge amara abalị 60 a, dịka USCIS (bụ ngalaba na-ahụ maka okwu metụtara mbịara mbịara)si kwuo, bụ ohere e nyere ka ụfọdụ ndị ọrụ abughị ndị mbịara mbịara bụ ndị ji akwụkwọ visa: H-1B; E-1; E-2,E-3,L-!, H-1B1; O-1 na TN, ịka nọrọ n'Amerịka dịka ha na-agbalị ịgbanwe akwụkwọ visa, nweta ọzọ.
Kedụ ihe Naijiria na-eme maka okwu a ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Minista Naịjirịa na-ahụ maka mmekọrịta Naịjirịa na mba ndị ọzọ nakwa onyeisioche Alaka Ecowas na-ahụ maka mkpeziokwu nakwa nchekwa bụ Yusuff Tuggar gosiri nnukwu mwute etu iwu ọhụrụ mba Amerịka na-atụpụtaga ga-esi emetụta mba ndị dị n'Afrịka ọkachasị Naịjirịa.
O kwuru na mịnịstrị ya na-eke ajị n'ume ịchọcha nakwa ịkpọlata ụmụamala Naijiria aha ha dị n'akwụkwọ na akwụkwọ ha ezughị ezu.
Maazi Alkassim Abdul Kadir, bụ onye enyemaka pụrụ iche n'okwu mgbasaozi nke minista kọwakwara BBC maka akwụkwọ ozi nke ngalaba Amerịka na-ahụ maka nchekwa mba ahụ zitere ha gwaha ka ha hụ na ụmụala ha na-apụ apụ na-edebanye aha ha nke ọma, ma lebanyekwa anya na ụmụamala Naịjirịa nọ Amerịka bụ ndị ejighị akwụkwọ njem maka ndị abụghị ndị mbịarambịa, ma kwuo na ha na-elebanya anya imezu nke a.
Ihe Ecowas na-ekwu mmachi ahụ nwereike ime

Ebe foto si, Reuters
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Tuggar , onye kwuru n'aha Ecowas n'ọgbakọ nke 54 nke ngalaba na-ahụ maka mkpeziokwu na nchekwa mere n'Abuja, Naịjirịa na nsonso a, dọrọ aka na ntị na "ọ bụrụ na Donald Trump machie anyị, ọ ga-egbochi azụmahịa, mmekọrịta na uto mpaghara a," dịka o siri kwuo.
"Ọ ga-ajọgbu onwe ya ma ọ dị ire, maka na anyị nwere ọtụtụ ohere ma dịkwa njikọrọ inwe nkwekọrịta ga-aba uru."
Tuggar kọwara nzọpụ ụkwụ ahụ dịka ndajọ metụtara mba na mba nke ga-emetụta mmekọrịta akụbaụba oge Ọdịda Anyanwụ Afrịka na-ele anya njikọta aka n'etit ha na mba ụwa.
" Anyị nwere ọnatarachi nakwa aja dị ụkọ na mba dịka samarium si monazite nke a na-enweta na steeti m bụ Bauchi."
"Anyị nọ na mpaghara ụwa ebe ma ka okwu azụmahịa mba na mba si aga tupu oge ugbua."
Mịnịsta ahụ kpọrọ oku ka mba Amerịka tulegharịa atụmatụ ahụ , ma dọọ aka na ntị na mpaghara Ọdịda anyanwụ nwere ohere ile anya ebe ọzọ maka mmekọrịta.
"Mba ndị dị na Ecowas na Amerịka nwere ohere ijikọta ọnụ dịka mkpa ha siri dị. Anyị nwekwara ohere anyị na mba ndị dị anya na-arụpụta mmanụ inwe nkwekọrịta."
"Anyị ga-enwe nkwekọrịta maka ọganihu anyị.; otu ajụjụ bụ kedụ onye anyị na ya ga-enwe nkwekọrịta a? Kedụ onye ga-eweghara ohere ohere dị na mpaghara anyị ,nye ndị ọrụ gọọmentị , ndị ọkachamara na nka nakwa ndị ojiegoachụego ohere ịpụ na abata na-enweghị mgbochi iji nwee nkwekọrịta azụmahịa?"
Ruo ugbua, ụwa na-eche ka oge e nyere zuo iji mata mba ndị ọchịchị Trump ga-amachi obere maọbụ kpamkpam.









