Anụ ọkụkọ, mkpo tomato, ọgwụ na ngwaahịa ndị ọzọ e si Amerịka ebubata gọọmentị Naịjirịa machiri

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-ahụ maka azụmaahịa na mba Amerịka ekwupụtala mwute ha maka ụfọdụ atụmatụ mba Afrịka na-eme iji gbochie azụmaahịa n'etiti ha na mba Amerịka, site na iwu Amerịka tinyere nke metụtara azụmaahịa mbaụwa.
Mba Amerịka kwuru na mkpebi ahụ mba Afrịka ndị a na-eme 'adịghị mma'.
Ụlọọrụ a kwuru na mkpebi Gọọmentị Naịjirịa mere site n'ịmachi ngwaahịa ruru iri abụọ na ise e si mba Amerịka ebubata ga-emetụta ọtụtụ ụlọọrụ na-arụpụta ihe n'Amerịka.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
"Iwu ndị a etinye ọgbatauhie n'azụmaahịa nke butere ntufu ego nye ụfọdụ ụlọnrụpụta ihe na mba Amerịka bụ ndị chọrọ ihe ngalaba ha na Naịjirịa," ozi ụlọọrụ azụmaahịa mba Amerịka wepụtara n'akara soshal media X.
Nke a na-abịa n'ime ụbọchị ole ma ole Onyeisiala Donald Trump tinyere ụtụisi ọhụrụ n'elu ọtụtụ ngwaahịa ndị e si na mba ndị ọzọ ebubata mba Amerịka.
Iwu a metụtara mba ruru isi asaa gụnyere mba Chaịna na mba Yurope nke mere esemokwu azụmaahịa n'etiti ha.
Chaịna adịla mbụ bulie ụtụisi dị na ngwaahịa ndị e sin a mba Amerịka ebubata na mba ha ruo pasentị 84, dịka Trump buliri nke ha ruo pasentị 104.
Mba ndị Yurope tinyere pasentị 25 na ngwaahịa ndị e si na mba Amerịka ebubata na mba ha.
Ụfọdụ ngwaahịa ndị e si Amerịka ebubata a machiri

Ebe foto si, State House/Getty Images
Ụlọọrụ mba Amerịka kwuru ngwaahịa ndị a machiri ịbata Naịjirịa gụnyere ngwa nri, ọgwụ, anụ na ọkụkọ, mmanya na ihe ndị ọzọ.
N'afọ 2025, gọọmentị Naịjirịa kwuru na ha ga-agwa ụlọakụ etiti ka ha kwụsị inye ndị na-azụahịa ego dọla maka iji ebubata ngwaahịa si na mba ọzọ.
Gọọmentị kwuru na ha chọrọ ịkwalite ngwaahịa ndị a na-arụpụta na Naịjirịa. Ngwaahịa ndị a gụnyere;
- Nnụnụ dị ndụ maọbụ nke e gburu egbu, gụnyere anụ ọkụkọ e gburiri egburi.
- Anụ ehi na nke ezi
- Akwa ọkụkọ
- Mmanụ e ji esi nri
- Shuga (ọtọbịrịbịrị)
- Mmanụ koko bọta
- Spageti na pasta ụmụaka
- Tomato ndụ maọbụ nke mkpo
- Mmanya ndị dị na katọn nwere mkpụrụosisi n'ime ha
- Mmiri na mmanya ndị gbara na mkpo
- Sementi a rụrụ arụ
- Ọgwụ
- Ọgwụ ndị mebiri emebi
- Fetịlaịza ọ gbara ọhụrụ (NPK 15-15-15)
- Ncha na ọgbọ ụfụfụ e hi asa akwa
- Ọgwụ e ji egbu anwụnta (Leko rope)
- Ụkwụ 'tire' ụgbọala ochie
- Kadbọd na akwụkwọ ndị e ji ese ihe
- Kapet na rọgụ
- Akpụkpụ ụkwụ, akpa na igbe
- Karama ndị buru ibu karịa 150ml
- Igwe ntụoyi mere ochie
- Ụgbọala ndị karịrila afọ iri na abụọ
- Mkpịsị e ji ede ihe
E wepụ Naịjirịa, mba Angola bụ ndị kachasị ebubata anụ ọkụkọ site na mba Amerịka, na nso nso a kwuru na ha ga-amachi mbubata anụ ezi na nke ọkụkọ na mba ha malite n'ọnwa Julaị afọ a.
Ụlọọrụ azụmaahịa mba Amerịka kwuru na nke a ga-emetụta ndị ọrụ ugbo na-azụ ọkụkọ na mba ha.
Etu mmachi Donald Trump ga-esi emetụta mba Afrịka
Mba Amerịka tinyere ụtụisi ọhụrụ ruru pasentị iri n'isi ngwaahịa si ọkara mba Amerịka abata na mba ha, mana mba ndị dịka Naịjirịa na Saụt Afrịka ga-enwete ụtụisi karịrị dịka e tinyere ụtụisi pasentị 14 ebe Saụt Afrịka bụ pasentị 30.
Mana onyeisiala mba Amerịka akwụsịtụla atụmatụ ahụ ịga n'ihu ma kwuo na a ga-ebelata ya.
Mba Afrịka kachasị akwụ ụtụisi na ngwaahịa na-abanye Amerịka bụ Lesotho nke ruru pasentị 50 ebe Madagaska bụ pasentị 47.
Naịjirịa bupuru ngwaahịa ego ya ruru ijeri dọla atọ na ụma ise ($3.5bn) na mba Amerịka n'afọ 2022, ọkachasị na mmanụ agbidi, nke bụ pasentị ise na ngwaahịa ha na-ebupu na mba Amerịka.
Ya mere etu ụtụisi a mba Amerịka tinyere na ngwaahịa mba Afrịka na-ebuba n'Amerịka ga-esite n'ọnụọgụgụ ngwaahịa ole mba ahụ na-ebubata.









