Agha azụmahịa Amerịka na Chaịna: Kedụ ka ọ ga-esi metụta Afrịka?

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump azọpụla njem mbụ ha n'ihe ọtụtụ mmadụ kọwara dika agha azụmahịa nke ha na mba ndị ọzọ kachasị agbakọrọ ha aka gbasara akụnụba.
N'ụbọchị Mọnde, Trump kwụsịtụrụ atụmatụ ibuli ụtụisi Meziko na Kanada ruo ụbọchị iri atọ (30).
Dịka ọtụtụ mmadụ kwenyere na atụmatụ mba Amerịka ahụ nwere ike ịmụba agha azụmahịa, ndị nnyocha okwu n'Afrịka nọ na-atụle ebe mba ahụ nwereike izute ihe ọdachi.
Naịjirịa, Kenya, Gana, Angola na Saụt Afrịka so n'ime mba ndị ha na Amerịka kachasị atụkọrịta mgbereahịa n'Afrịka.
Dịka ụlọọrụ onye nnọchiteanya azụmahịa Amerịka sịrị kwuo, ngwaahịa Amerịka tụbatara site na Saụt Afrịka bụ nke ọnụego ya dị ijeri dọla iri na anọ na ụma isii ($14.6bn) n'ozuzuoke ebe ha bụ ngwaahịa gụnyere pịal, ọlaedo na igwe. Ngwaahịa ndị ọzọ gụnyere ọlaedo, koko, yuranium, alụminịụm, igwe iron na steel si mpaghara Afrịka ndị ọzọ gụnyere Gana, Aịvri Kost, Gambịa na Senegal.
N'otu afọ ahụ, obodo kachasị nwee ọnụọgụ mmadụ n'Afrịka, bupụrụ ngwaahịa ruru ijeri dọla anọ na ụma asatọ ($4.8bn) gaa Amerịka nke ihe kachasị n'ime ya bụ mmanụ agbịdị, koko, nri si n'ugbo na ihe ndị ọzọ, ebe ha na-ebubata ụgbọala, igwe, na mmanụ ala a ṅụchara aṅụcha site na mba ahụ nwere nnukwu akụnụba.
Mpịakọta azụmahịa ndị a nwereike daa nke ukwuu ọ bụrụ ma Trump bulie ụtụisi n'Afrịka.
Mba Afrịka na-erite uru ugbu a site n'iwu Africa Growth and Opportunity Act (AGOA) nke bụ iwu azụmahia Amerịka na-enye ohere ka obodo ndị dị na mpaghara ndịda Sahara na-ebupụ ngwaahịa na US na-akwụghị ụtụisi.
Iwu ahụ Onyeisiala Bill Clinton binyere aka n'afọ 2000 ka emegharịrị kemgbe, dịka nke kacha nso bụ nke e megharịrị na 2015.
Enwere ụjọ n'etiti ụfọdụ ndị nọ n'Afrịka na Onyeisiala Trump nwereike ọ gaghị akwado mmeghari nke iwu ahụ dịka akụkụ nke atụmatụ akụnaụba ya ga-ebu ụzọ lebara ndị Amerịka anya.
"Ozugbo e webatara ụtụisi na ngwụcha AGOA, ndị nwere obere ụlọọrụ n'Afrịka ga-ata ahụhụ." ka Obiora Madu, onyeisi ụlọọrụ Africa Centre for Supply Chain gwara BBC.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ugbua, AGOA na-enye mba 32 tozuru oke n'Afrịka ikike ibupu ọtụtụ ngwaahịa ugbo, akpụkpọ anụ, akụrụngwa ụgbọala, kemịkalụ, mmanya, igwe na ihe ndị ọzọ.
Mmebi akụnụba a tụrụ anya ya site na nke a nwereike bute mbelata na ngwaahịa niile e mepụtara n'obodo (GDP). United Nations buru amụma uto GDP nke 3.7% na 2025, site na 3.4% na 2024 ebe ụlọakụ African Development Bank buru amụma uto 4.2% n'afọ a, site na 3.8% n'afọ gara aga.
Ndị nnyocha na-enyochakwa mmetụta ndakpọ akụnụba Chaịna pụrụ inwe n'Afrịka n'ihi ụtụisi Trump buliri elu
Chaịna ekwuputala usoro mmegwara megide atụmatụ Onyeisiala Trump, ma kwuo na ha ga-agbakwunye ụtụisi 15% na ngwaahịa ndị e si Amerịka tụbata dịka kool, gaasị na ụgbọala. Beijing ekwupụtakwala ebumnuche ya itinye akwụkwọ mkpesa na World Trade Organisation.
N'ime afọ ndị na-adịbeghị anya, China enweela ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba na Afrịka, ma bụrụkwa mba kacha ukwuu na-agbakọrọ mba ahụ aka na azụmahịa ruru narị ijeri dọla abụọ na iri asatọ na abụọ ($282) na 2023.
Mba ahụ na-ebubata akụrụngwa dị iche iche na mmanụ ọkụ sitere na Africa ebe ha na-ebupụ ngwaahịa arụpụtara.
Naijiria ka bụ nnukwu ahịa maka ngwaahịa ndị Chaịna na Afrịka ebe a na-atụ egwu ihe mgbochi na ahịa Amerịka nwereike ịmanye Chaịna imeju ahịa Africa na ngwaahịa ya.
"China nwereike ịkwaju ngwaahịa ya n'Afrịka ma mee ka Afrịka bụrụ ebe a na-ekpofu ngwongwo ha, na-etinyekwa ndị na-emepụta ihe n'obodo anyị n'ihe ize ndụ." ka Dele Ayemibo bụ ọkachamara n'ịzụ ahịa gwara BBC.
Ụfọdụ mba Afrịka anọwo na-agbasi mbọ ike ịkwabata ngwaahịa na-adịghị mma nke site n'Eshia, n'agbanyeghị mbọ nke usoro nhazi obodo na-eme iji kwụsị omume ịkwatu ihe, mba ahụ na-aga n'ihu na-enweta nnukwu mfu site na omume ahụ.
Nkwekọrịta African Continental Free Trade Agreement, AfCFTA emejupụtabeghị ebumnobi ya kemgbe ọ malitere ihe dịka afọ ise gara aga. Enweghị akụrụngwa, mgbochi azụmaahịa, enweghị usoro ime njem zuru okè na akụrụngwa okeala egbochiela mmejupụta AfCFTA, na-achọ ọtụtụ ijeri ego ka ọ rụọ ọrụ nke ọma.
"Akụ na ụba Africa kwesịrị ịmụba mmetụta nke AfCFTA. Ha kwesiri ịkwalite oke azụmahia ma mee ka ọ rụọ ọrụ." ka Obiora Madu gbakwunyere.
Njikọ nke ọtụtụ mba ndị dịka Brazịl, Rọshịa, Indịa, Chaịna na Saụt Afrịka tọrọ ntọala BRICS iji kwalite mmekọrịta akụnụba dị n'etiti ndị otu ha na ibelata mmetụta nke dọla dịka isiego e ji atụ mgbere. Mba Afrịka ndị ọzọ anabatara gụnyere Ijilt, Itiopịa, Naịjirịa, Ọljirịa na Yuganda.
N'izuụka gara aga, Onyeisiala Donald Trump dọrọ mba ndị otu BRICS aka na ntị ka ha dochie dọla Amerịka dịka ego nchekwa ego ha site n'iyi egwu ọzọ itinye ụtụisi 100% o kwupitaburu izu ole na ole mgbe ọ meriri ntuliaka onyeisiala n'ọnwa Nọvemba.
"Enweghị ohere na BRICS ga-anọchi dọla Amerịka n'azụmahịa mbaụwa, maọbụ n'ebe ọ bụla ọzọ ebe mba ọ bụla ga-agbalị ime nke ahụ ga-adị njikere maka ụtụisi ma feere Amerịka aka," ka ọ gbakwunyere.
Mba ndị dị n'Afrịka nọ n'ihe ize ndụ nke isiego dị ala site na nnukwu ego ọmụrụnwa nke Amerịka webatara, dị ka ụzọ isi ebelata ọnụahịa na-arị elu. Ego mba dị iche iche gụnyere naịra nke Naịjirịa, Rand nke Saụt Afrịka na Shilling mba Kenya, na-eme ka ike ịzụrụ ihe na-esiwanye ike.
Agha azụmaahịa na-ewepụtakwa ohere maka mba Afrịka.
Etu ọ dị, aka mgba na-echere akụnụba mba ndị a na-emepeghị emepe na-eme ka ọ bụrụ ihe mgbochi, na-ekpuchi ohere n'agha azụmahịa dị n'etiti ndị dike, na-egbochi ha inweta ụgwọọrụ nke nwereike ịbụ nke ha.
"Afrika ga-erite uru n'agha azụmahịa a ma ọ bụrụ na ha teta ma dozie usoro ha," ka Maazị Ayemibo kwuru.









