Etu ọpụpụ Mali, Niger na Burkina Faso site n'Ecowas ga-esi metụta azụmaahịa n'Afrịka

Ebe foto si, Burkina Faso Presidency
- Onye dere ya, Nkechi Ogbonna
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Ndịagha na-edu Niger, Mali na Burkina Faso akwụsịla mmekọrịta ha na otu Economic Community of West African States (ECOWAS). N'ụbọchị Satọde 6 Julaị, 2024 ka mba atọ a binyere aka n'akwụkwọ nkwekọrịta n'okpuru Alliance for Sahelian States (AES), na-ekwusi ike mkpebi ha ịpụ n'otu ECOWAS
Mali nọ n'okpuruọchịchị ndịagha kemgbe afọ 2020, Burkina Faso kemgbe afọ 2022 na Niger kemgbe afọ 2023, nke mere ECOWAS ji nwe machie iji manye ka ha laghachi n'ọchịchị onye kwuo uche ya. Na nzaghachi, mba atọ ahụ kpebiri ịpụ n'otu ahụ.
Ha kwuru na ọ bụ n'ụbọchị 29 Jenụwarị 2025 ka ha ga-apụ kpam kpam n'otu Ecowas ma kwụsị mmekọrịta ha na ndu otu a.
Na nzaghachị, Ecowas kwuru na ohere ka dịịrị mba ndị a isonye n'otu ha. Ndị ndu ha kwuru na mba ndị a nwere ohere ọnwa isii ịlọghachịte n'otu Ecowas malite n'ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Juun afọ 2025.
Ọpụpụ mba ndị Sahel a na-apụ ga-emetụta mmekọrịta ụmụafọ bi na mba ha nakwa mba ndị so n'otu Ecowas n'ụzọ dị iche iche dịka azụmaahịa, ime njem dgz.
Kedụ ka ọ ga-esi metụta azụmaahịa na mpaghara Afrịka?

Ebe foto si, Getty Images
Site na anụ ruo na yabasị, ụfọdụ ihe oriri nwere ike ịka ọnụ. A mara mba ndị dị na mpaghara Sahel dịka ndị n'emepụta anụ ụlọ na akwụkwọ nri, bụ́ ndị ha na-ebuga n'odịda Anyanwụ Afrịka. Mbugharị nri sitere na mba ndị a ga-eme ka ọnụ ahịa bawanye ma ọ bụrụ na mba atọ a kwụsi inwe ikike tarifu nke Ecowas na-enye.
Ọ ga-apụta na ndị Naijiria, ndị Ghana, Senegal na mba ndị ọzọ nọ na Ọdịda Anyanwụ ga-akwụ nnukwu ụgwọ maka nri ndị mba Sahel na-ewetakarị. Ibugharị nri ga-adịkwa ọnụ karịa n'ihi nke a.
Ụlọọrụ Trans-Saharan Gas Pipeline (TSGP) bụkwa nnukwu ọrụ nke ọpụpụ a ga-emetụta. A na atụ anya na ga-amalite ọrụ na afọ 2030, TSGP bụ ọrụ jikọrọ ọnụ n'etiti Nigeria, Niger na Algeria. Ejiri pipeline ahụ dị kilomita 4,000 na-ebufe mmanụ gas ruru ijeri cubic mita 30 kwa afọ site na Nigeria, site na Niger, ruo Algeria.
Gịnị ga-eme njem?

Ebe foto si, Alamy
Ime njem nwere ike isiri ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka ike. Ewebatara akwụkwọ paspọtụ Ecowas na Disemba afọ 2000, na-enye mba ndị otu ya dị 15 ikike ịbata obodo ha n'efu na-ejighị akwụkwọ njem mba ofesi 'visa'.
Ụmụ amaala Ecowas nwere ikike ibi n'ime obodo ndị so n'otu ya ruo ọnwa 3, mana nke a nwere ike ịgbanwe maka ndị na-eme njem na mba ndị ahụ pụrụ n'otu ECOWAS.
Ọ nwere ike mebie njikọta mpaghara, emume ịzụ ahịa, mmepe akụnaụba, yana nkwekọrịta azụmahịa n'efu nke mba Afrịka.
Kedụ ka ọ ga-esi metụta Mali, Niger na Burkina Faso?

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Mba atọ a enweghị ọdụ ụgbọ mmiri na ohere ịbanye n'oké osimiri, na-eme ka ha dabere na ndị agbata obi ha dị n'akụkụ osimiri gụnyere Togo, Benin, Ghana, na Nigeria maka azụmahịa mba ụwa.
Dịka Ecowas Trade Information Systems (ECOTIS) siri kwuo, n'afọ 2022, mbupụ ngwahịa Mali ruru ijeri $3.9, ebe mbubata ruru ijeri $6.45, ebe mbupụ Burkina Faso bụ ijeri $4.55, mbubata ha bụ ijeri $5.63. Niger dekọrọ nde $446.14 na mbupụ ya na ijeri $3.79 na mbubata.
Ọ bụrụ na azụmahịa ndị a niile ga-aga n'ihu, mba Sahel ndị a ga-achọ ịnweta ọdụ ụgbọ mmiri nke mba ndị ọzọ dị n'ebe Ọdịda Anyanwụ Africa, nke ga-adọta ụgwọ dị elu - na tarifu na ọrụ - ma ọ bụrụ na ha akwụsị ịbụ ndị òtù Ecowas.
Ụbọchị ụka gara aga, onyeisi ECOWAS bụ Omar Touray dọrọ aka na ntị na ị si n'otu ECOWAS pụọ ga-enwe nnukwu mmetụta nye mba Sahel atọ ahụ.
Ndị isi ndị otu ECOWAS e kwuola na e nwere ike inwe nkewa nke nwere ike ebute enwghị nchekwa . Mpaghara Sahel bụ ndị otu jihadist wakporo ugborougboro nke a na-ekwu nwere ike ị kesa na mba Afrịka ndị ọzọ.
Ndekọ iyi ọha egwu zuru ụwa ọnụ e mere n'afọ 2022 chọpụtara na mpaghara Sahel dị ka ebe ndị otu na-eyi ọha egwu na-eto ngwa ngwa ma na-egbu ndị mmadụ. A kọwapụtara mpaghara ahụ dị ka ebe ọhụrụ nke iyi ọha egwu, nke kwuru na ọ bụ "maka ọnụ ọgụgụ mmadụ dị elu, enweghị mmiri na nri zuru oke, mgbanwe ihu igwe na ọchịchị ndị na-adịghị ike" butere ya.








