Abdourahamane Tchiani: Ọchịagha a ekwupụtala onwe ya dịka onyeisiala Niger Republic

Ebe foto si, RTN
Ọchịagha Abdourahmane Tchiani ekwupụtala onwe ya dịka ondu ọhụrụ nke mba Niger Republic dịka ndị agha weghaara ọchịchị n'ike na mba ahụ.
Tchiani, onye a ma dịka Omar Tchiani, dị afọ 62 ma bụrụkwa onyeisi ndị agha na-eche onyeisiala nche kamgbe afọ 2011.
N'afọ 2018 ka onyeisiala Mahamadou Issoufou buliri ya n'ọkwa 'General'.
Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na onyeisiala nke a chụpụrụ n'ọchịchị bụ Mohamed Bazoum nọ n'ezi ahụike, mana ndị agha ka jichiri ya.
N'okwu o kwuru n'onyonyo TV, Tchiani kwuru na ha ihe kpatara ha ji weghara ọchịchị n'ike bụ n'ihi ọtụtụ ọjọọ na-aga n'ihu na mba Niger ugbua dịka enweghị nchekwa, ndakpọ akụnụba, na nrụrụaka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.
Ndịagha Niger ekwupụtala mweghara ọchịchị mba ahụ n’ihu ọha

Ebe foto si, RTN
Ndịagha mba Niger zipụtara ozi site n’ihe onyonyo gbara n’igwe TV mba ahụ ma kwuo na ha ewegharala ọchịchị mba ahụ.
Ha kwuru na ha akagbuola iwu mba ahụ, kwụsị ngalaba gọọmentị niile ọrụ nwamgbe nta ma gbachie okeala ha niile.
Kemgbe ebe ụtụtụ Wenezde ndịagha nchekwa nke onyeisiala Mohamed Bazoum jibidoro ya.
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Antony Blinken ekweela nkwa site n’ozi o zitere n’ekwentị na ọ ga-akwudoro ya.
Onyeisi otu UN bụ Antonio Guterres kwukwara na o kwutuuru onyeisiala ahụ ma kwuo na otu UN ga-enye ya nkwado n’uju.
Bazoum so na ndị ọchịchị na-ebuso ndịagha nnupụisi nke ụka Alakụba agha na mpaghara ọdịda anyanwụ Afrịka.
Mba agbataobi ha abụọ bụ Mali na Burkina Faso danyere n’ọnọdụ mweghara ọchịchị nke ndị agha mere maka okwu ndị metụtara ọgbaghara ndịagha ụka Alakụba kpatara.
Na mba abụọ ahụ, ndị isi ọchịagha abụọ ebe ahụ na ndị ọchịchị mba France bụ ndị chịrị ha n’oge gara aga nwere eseomokwu.
Mba France chịkwara mba Niger n’oge gara aga.
N’ozi ọchịagha Amadou Abdramane nakwa mmadụ itoolu ndịagha ndị ọzọ nọ ya n’akụkụ zipụtara n’ihe onyonyo TV nke mba ahụ n’ụbọchị Wenezde, o kwuru “Anyị bụ ndị ọrụ nchekwa... ekpebiala ịkwụsị ọchịchị ochie unu ma”.
“Nke a so ọnọdụ enweghị nchekwa na-akawanye, ndakpọ akụnụba nakwa ọchịchị ọjọọ”.

Ebe foto si, AFP
O kwukwara na akwụsịla ngabala nakwa ụlọọrụ gọọmentị niile ọrụ nwamgbe nta ma kwuo na ndị minista niile ga-amalite ịrụ ọrụ e nyere ha kwa ụbọchị.
“Anyị na-agwa ndị ọchịchị ndị ọzọ si n’ezi ka ha ghara itinyeaka ebe a” ọ gara n’ihu kwuo “anyị agbachiela okeala nakwa oke elu anyị niile ruo mgbe anyị nwereike tinyeghachie udo”.
Ọ gara n’ihu tinye ọnọdụ mmachi mkpagharị ndị mmadụ malite n’elekere 11 nke abalị ruo elekere ise nke ụzụ ụtụtụ.
Ọnọdụ a ga-aga n’ihu ruo mgbe ekwepụtabeghị.
Ọchịagha Abdramane kwuru na ndịagha na-arụrụ otu ọchịchị National Council for the Safeguard of the Homeland (CNSP) ọrụ.
Mgbe ha zipụtachara ozi mweghara ọchịchị a, Maazị Blinken nke mba Amerịka kpọrọ oku ka a tọhapụ onyesiala Bazoum.
Ọ gwara ọgbakọ ndị ntaakụkọ na mba New Zealand na “ihe a pụtara na ndị a na-agba mbọ iwere ọchịchị n’ike nakwa ịkụsa usoro ọchịchị”.
Na mba agbataobi ha bụ Mali, ndị otu nchekwa mba Russia bụ Wagner bu ọtụtụ ngwa ọgụ na-nyere mba ahụ aka na agha ha na-ebuso otu ndịagha nnupụisi ụka Alakụba na-akpa ike ebe ahụ.
Ọgbaghara na-ada Niger na-abịa dịka ọtụtụ ndị mba ofesi na-eche ezigbo echiche maka mgbasa ọrụ Wagner na mpaghara ọdịda anyanwụ nakwa ọwụwa anyanwụ Afrịka.
Onyeisiala Russia bụ Vladimir Putin nke na-achọ igbasa ikike ọchịchị Russia n’Afrịka na-elekọta ọgbabọ ụfọdụ ndị isi ala mba Afrịka na St. Peterburg n’ụbọchị Tọọzde a.
Iji nọchite anya Ecowas, onyeisala Benin bụ Patrice Talon awụchiela isiobodo Niger bụ Niamey iji malite atụmatụ ikpe udo.
Maazị Talon kwuru na “a ga-anwa ụzọ niile” n’okwu ikpe udo a ọ bụ na ọ ga-eweghachite udo “mana ihe anyị na-achọ bụ ka e mee ihe niile n’ụzọ udo nakwa ịdịn’otu”.
N’ebe ụtụtụ ụbọchị Wenezde, igwe ndị mmadụ wụchiri na Niamey, pụta igosi nkwado ha nye Bazoum. Onye ntaakụkọ BBC ebe ahụ hụrụ ọtụtụ ndịagha pụtara wụchie n’akụkụ ụlọ ntaakụkọ mba ahụ.

Ebe foto si, AFP
Ime obodo ahụ nọ n’ọnọdụ udo mana ndịagha a weghaara ọchịchị a gbara egbe ebe ahụ iji chụsaa ndị pụtara ime ngagharịiwe.
Mba Niger nọ n’ọnọdụ enweghi nchekwa nke otu ndịagha nnupụisi ụka Alakụba abụọ nọ n’isi ha – otu na mpaghara ọdịda anyanwụ (bụ ndị si Mali wụbata n’afọ 2015) nakwa otu ọzọ na mpaghara ọwụwa anyanwụ (bụ ndị agha nnupụisi si n’akụkụ mpaghara ukwu Naịjirịa wụbata).
Otu ndịagha nnupụisi bụ alaka ngalaba al-Qaeda na Islamic State na-akpa ike na mba ahụ.
Onyeisiala Bazoum, bụ onye etinyere n’ọchịchị site na ntuliaka 2021 bụ ezi enyi mba France nakwa mba ndị ofesi ndị ọzọ.
Mweghara ọchịchị emeela ugboro anọ na Niger kemgbe ha nwetere nnwereonwe n’aka France n’afdọ 1960 dịka enwekwaala oge ụfọdụ nwara ugboro ugboro iweghara ọchịchị ebe ahụ.










