Guinea Bissau coup fears: A nwụchiela ndị chọrọ ịnapụ ọchịchị n'ike na mba ahụ

Armed men wearing camouflage fatigues drive a truck through the streets

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Armed soldiers were seen patrolling the city's streets

Onyeisiala mba Guinea Bissau bụ Umaro Sissoco Embalo sị na udo alọghachịla na mba ha ugbua site na nkata ndị ụfọdụ kpara ịnapụ ọchịchị n'ike.

Ọ sị na ndị kpara nkata a kpara ya ọfụma mana gọọmentị ewerekwala ọchịchị ya.

Embalo sị na e nwere ọtụtụ mmerụ ahụ site n'ọgbaghara ahụ mana o kwughi mmadụ ole o metụtara.

Ọ sị na a nwụchiela ụfọdụ ndị chọrọ ịnapụ ọchịchị n'ike na mba ha mana ọ kọwaghị ka o si mee n'uju.

Umaro Sissoco Embalo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Umaro Sissoco Embalo meriri ntuliaka ma zọta ọkwa onyeisiala na mba Guinea Bissau n'afọ 2019

Cheta na akụkọ pụtara n'ehihie Tuzde na ụda egbe na-ada n'akụkụ obi ọchịchị gọọmentị mgbe onyeisiala na ndị minista na-eme nzuko n'ime obi.

E mechisiri ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ ebe e zipuru ndịagha n'isiobodo mba ahụ.

Kemgbe afọ 1980 Guinea Bissau nwere onwe ya n'aka mba Pọtụgalụ, ndị agha anwaala ma wegharakwa ọchịchị ugboro itoolu na mba ahụ.

A soldier patrols the government palace area in Bissau, capital of Guinea-Bissau, on February 1 2022

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Soldiers could be seen patrolling the government palace area

Cheta na ndị agha ewegharala ọchịchị ugboro ugboro n'Afrịka n'ime ọnwa iri na asatọ garala aga.

Nso nso a, ndị agha wegharala ọchịchị na mba Burkina Faso, tinyere Mali, Guinea na Chad.

Ndị isiala mpaghara West Afrịka, n'okpuru Economic Community of West African States (Ecowas) katọrọ ihe ha kpọrọ "ịnwa mweghara ọchịchị n'ike", ma rịọ ndị agha ka ha laghachị n'ọdọ ha.