Guinea Bissau coup fears: A nwụchiela ndị chọrọ ịnapụ ọchịchị n'ike na mba ahụ

Ebe foto si, Reuters
Onyeisiala mba Guinea Bissau bụ Umaro Sissoco Embalo sị na udo alọghachịla na mba ha ugbua site na nkata ndị ụfọdụ kpara ịnapụ ọchịchị n'ike.
Ọ sị na ndị kpara nkata a kpara ya ọfụma mana gọọmentị ewerekwala ọchịchị ya.
Embalo sị na e nwere ọtụtụ mmerụ ahụ site n'ọgbaghara ahụ mana o kwughi mmadụ ole o metụtara.
Ọ sị na a nwụchiela ụfọdụ ndị chọrọ ịnapụ ọchịchị n'ike na mba ha mana ọ kọwaghị ka o si mee n'uju.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na akụkọ pụtara n'ehihie Tuzde na ụda egbe na-ada n'akụkụ obi ọchịchị gọọmentị mgbe onyeisiala na ndị minista na-eme nzuko n'ime obi.
E mechisiri ụlọakwụkwọ na ụlọọrụ ebe e zipuru ndịagha n'isiobodo mba ahụ.
Kemgbe afọ 1980 Guinea Bissau nwere onwe ya n'aka mba Pọtụgalụ, ndị agha anwaala ma wegharakwa ọchịchị ugboro itoolu na mba ahụ.

Ebe foto si, AFP
Cheta na ndị agha ewegharala ọchịchị ugboro ugboro n'Afrịka n'ime ọnwa iri na asatọ garala aga.
Nso nso a, ndị agha wegharala ọchịchị na mba Burkina Faso, tinyere Mali, Guinea na Chad.
Ndị isiala mpaghara West Afrịka, n'okpuru Economic Community of West African States (Ecowas) katọrọ ihe ha kpọrọ "ịnwa mweghara ọchịchị n'ike", ma rịọ ndị agha ka ha laghachị n'ọdọ ha.









