Burkina Faso Coup: Etu ndị agha Burkina Faso si napụ onyeisiala Roch Kabore ọchịchị

Roch Kabore

Ebe foto si, Reuters

Ndị agha nnupuisi achụtuola onyeisiala Burkina Faso bụ Roch Kabore n'ọchịchị.

Nke a mere n'ụtụtụ Mọnde, abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Jenụwarị afọ 2022.

N'abalị ụbọchị Sọnde ka e bidoro nụwa ụda egbe n'akụkụ ogige onyeisiala nakwa n'ọgbe ndị agha dị n'isi obodo, Ouagadougou.

Mana gọọmenti mba ahụ gọrọ agọ na onweghị ihe dịka nnapụ ọchịchị n'ike na-eme maọbụ nnwụchị onyeisiala ha.

N'ụtụtụ ụbọchị Mọnde, akụkọ malitere ifegharị na ndị agha ejichiela onyeisiala Roch Kabore.

Otu onyonyo gosiri etu e si were mgbọ gbakasia ụgbọala e chere na Onyeisiala na-eji apụ.

Ndị agha nnupuisi Burkina Faso nwụchịrị onyeisiala Roch Kabore.

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ụgbọala e chere na Onyeisiala Roch Kabore na-eji apụ mkpagharị.

Onye ntaakụkọ BBC bụ Simon Gongo kwuru na ndị agha gbara ogige ụlọọrụ mgbasaozi nke steeti okirikiri.

Akụkọ na ekwu na ụfọdụ ndị agha ahụ na-ekwu na ha chọrọ ka achụọ ndị isi ndị agha niile ma nwetekwuo ngwa agha a ga-eji buso ndịagha alakụba agha.

N'abalị Mọnde ka ụlọọrụ TV na mba Kenya gụpụtara akwụkwọ ozi nke ha sị na Onyeisiala Roch Kabore dere iji gbaa arụkwaghị m.

Akwụkwọ ozi ahụ kwuru: "Dịka m tulere ihe ga-akara obodo anyị mma, bịakwa tulee ihe niile merela kamgbe ụnyaahụ (Jenụwarị 23), ekpebiela m ịgba arụkwaghị m dịka onyeisiala Burkina Faso, onyeisi gọọmentị nakwa ọchịagha ndịagha mba anyị."

"Chukwu gọzie Burkina Faso."

Ọtụtụ mmadụ na-enwe aṅụrị maka nchụtu Kabore

Nwaanyị na-enwe aṅụrị

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị mmadụ nwere aṅụrị dịka akụkọ nchutu Roch Kabore pụtara n'ama.

Ihe karịrị mmadụ otu puku nuputara n'ama ọgbakọ dị n'obodo Ouagadougou n'ụbọchị Mọnde na-enwe aṅụrị maka etu ndị agha si chụtuo Roch Kabore n'ọchịchị.

Ọtụtụ n'ime ha gbara ọkọlọtọ mba Frannsị ọkụ dịka ha nọ na-agba egwu, na-enwerị aṅụrị.

Ịgba ọkọlọtọ mba Fransị ọkụ bụ iji gosipụta iwe ha maka mba Fransị bụ chịburu mpaghara ahụ n'oge gboo.

Ndị agha mba France ka nọ na mba Burkina Faso nakwa mba ndị ọzọ gbara ha gburugburu iji nyere ha aka buso ndị agha alakụba na-enye nsogbu na mpaghara ahụ.

Ihe mere ndị agha ji weghara ọchịchị na Burkina Faso

Ndị agha Burkina Faso

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị agha Burkina Faso pụtara n'onyonyo TV kwuo na ha akwasaala ọchịchị.

A na-eche na onyeisi ndị agha chụturu Kabore n'ọchịchị bụ Paul-Henri Sandaogo Damiba, onye ji ọkwa 'Lieutenant Colonel'.

Ndị agha ahụ kwuru na Roch Kabore akụọla afọ n'ala n'ijikọta obodo ha ọnụ, nakwa ịkwụsị ọnọdụ enweghị nchekwa nke na-achọ ịkụsa ntọnala obodo ha.

Chetakwa na ndị agha mba Mali kwukwara otu ihe ahụ oge ha weghaara ọchịchị n'ike n'ọnwa Mee 2021.

Ndị obodo Burkina Faso katọkwara otu 'Economic Community of West African States' (Ecowas) maka etu ha si ata mba ebe ndị agha weghaara ọchịchị ahụhụ.

Otu onye aha ya bụ Armel Ouedraogo gwara ndị ntaakụkọ sị: "Ecowas achọghị ịma maka anyị, naanị ihe ha na ndị ọchịchị mba ndị ọzọ ma bụ ịta ndị mmadụ ahụhụ."

Ihe ị kwesịrị ịma maka Roch Kabore

Roch Kabore

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Roch Kabore arụbuola ọrụ dịka onyeisi ụlọ omeiwu Burkina Faso, tupu o merie ntuliaka ọkwa Onyeisiala n'afọ 2015 nakwa 2020.

Roch Kabore malitere ọrụ dịka onyeisiala Burkina Faso n'ọnwa Nọvemba afọ 2015.

O merikwara ntuliaka nke abụọ ya dịka onyeisiala n'ọnwa Nọvemba 2020.

Tupu oge ahụ, Kabore arụọla ọrụ dịka Mịnịsta na ngalaba dị iche iche na gọọmentị mba ahụ, dịka Mịnịsta njem na nzikọrịta ozi (1989), Mịnịsta ego na nhazi (1992-1993), Praịm Mịnịsta (1994), dgz.

Ọ rụkwaala ọrụ dịka onyeisi ụlọ omeiwu mba Burkina Faso n'afọ 2007.

Ihe dị mkpa maka Burkina Faso

Burkina Faso

Burkina Faso bụbụ mpaghara ndị French na-achị, ataala ahụhụ anụghị mmiri tọgbọ iko kamgbe ha nwetere nwereonwe na 1960 nakwa ọtụtụ nweghara ọchịchị.

Ọ bụ onye agha nnupuisi akpọrọ Thomas Sankara bara Burkina Faso nke pụtara 'ala ndị na-ekwu eziokwu"

Sankara weghara ọchịchị n'afọ 1983. A napụrụ ya ọchịchị ma gbuo ya n'afọ 1987.

Kamgbe afọ 2015, mba Burkina Faso na-ebuso ndị agha alakụba si mba Mali bata agha. Nke a ebutela ọnụma n'ebe ndị agha nọ ma mebie ụlọọrụ nlegharị anya mba ahụ.