Gabon Coup: Ụzọ ị ga-esi mara na ndịagha ewerela ọchịchị n'ike

Ndịagha Gabon

Ebe foto si, Gabon TV

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọ bụ n'ụbọchị Mondee nke ọnwa Jenụwarị ka ụfọdụ ndịagha na mba Gabon nwụchiri otu ụlọ mgbasa ozi n'ihe Bekee kpọrọ 'Coup'.

Mana chi ejighi mgbe achụsoro ha bụ ndịagha nupuru isi ma kpọchikwa ha.

Ọ bụghị sọsọ na Gabon, n'afọ 2014, ihe yiri ya mere na mba Gambia mgbe ndịagha nwara ị nara ọchịchị n'ike.

Ọgbaghara na akụkọ ụgha na-ewu ewu n'ụdịrị oge ahụ ya mere na BBC Igbo ga-agwa gị ụzọ ị ga-esi mara ma anapụọla ndị isiobodo ọchịchị n'ike.

  • 1. O nweghi onye ga-ekweta na o bụ 'Coup' n'ezie.
Ndị agha Naijiria

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọtụtụ mgbe Ndị agha turu ọnụ na ha anwụchiela Shekaụ ma ọ dị ndụ akpagharị

Ndị agha, ọ kachasị ndị na-anara ọchịchị n'ike agaghị ekweta na ọ bụ ihe ahụ ka ha na-eme.

Ị kwesiri ị gbaalị chọpụta nke bụ eziokwu, hie asaa n'anya ka ị nweike gbalahụ nsogbu.

  • 2. Kedu ebe onyeisiala nọ?
Buhari

Ebe foto si, Getty Images

N'ime ọgbaagahra niile na-eme, o nwereike ị bụ na ndịagha nara ọchịchị n'ike anwụchiela onyeisiala na be ya.

Chọpụta ebe onyeisiala nọ, ọ bụrụ na ahụrụ ya anya ma nụ olu ya, mara na ihe niile dị mma.

  • 3. Igwe mmadu ga-eju n'okporoụzọ (enwereike ị na-akwa mgbọ)
Ndị na-eme ngagharị iwe

Ebe foto si, Getty Images

Ọ bụghị iwu na ị ga-apụta n'ụlọ gị mana legharịa anya n'akụkụ gị; ndị mmadụ nwereike ị naa-akwa mgbọ ma na-emekwa ngagharịwe.

  • 4. Ụlọọrụ ndị gọọmentị ofesi ga-adọ ndị be ha aka na ntị
Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Dịka gọọmentị mba Amerịka siri mee na afọ 2017 mgbe echere na anapụla ọchịchị n'ike na mba Zimbabwe, gọọmentị ndịọzọ ga-ezipu ozi ị dọ ndị be ha aka na ntị.

  • 5. A na-anọchị ụlọ mgbasa ozi nke obodo

N'ihe yiri okwu Gabon, ndị na-achọ ị nara ọchịchị n'ike na-aga n'ụlọ mgbasaozi obodo nwụchie ya iji zipụ ozi na ha anọchiela ọchịchị.

  • 6. Akwa mmiri, ọdọụgbọelu nakwa oke obodo na-agbachi
Ndị agha na-eme nchekwa

Ebe foto si, Getty Images

Nke a bụ iji belata njem nakwa ọgbaghara nwereike ị bido maka akụkọ na-anapụla ndịisiala ọchịchị n'ike.

Ọ na-adị mma ka ndị mmadụ nọrọ be ha chekwq onwe ha tupu a mara nke bụ eziokwu mgbe ọbụla kepu kepu pụtara na ndịagha anapụla onyeisiala mba ọbụla ọchịchị n'ike.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: