Gabon Coup attempt: E gburu ndị agha abụọ soro nara ọchịchị n'ike

Gabon's president Ali Bongo

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, The Gabonese president is being treated in Saudi Arabia
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ si Gabon na-akọwa na ndịagha chọrọ ịnara ọchịchị n'ike na Gabon nọzị n'aka ndị nchekwa.

Gọọmentị Gabon kwuru na ha ji mmadụ anọ aka ha dị n'ihe a.

Ndị wakporo ụlọ ntaakụkọ gọọmenti ma zipụ ozi ka ndị mmadụ banye kpọkuba ka achụtuo Onyeisiala Ali Bongo.

Ha sị na ha mere nke a iji weghachite ọchịchi onye kwuo uche ya.

Ali Bongo bidoro ịchị mba ahụ n'afọ 2009.

Ezinaụlọ Bongo achịala Gabon ihe ruru afo 50.

Bongo dara ọrịa nkpọnwụahụ bụ "stroke" na Bekee n'ọnwa Ọktọba nke afọ 2018, ma nọọrọ mba Moroko ugbua na-anata ọgwụgwọ.

Agbanyeghị na o zipụrụ ihe nkiri iji gosi na ọ na ha agbake n'ute ọrịa n'ọnwa Jenụwarị, ndị agha a sị na ọ dabaghị, ma kwuo na ọ bụ 'usoro ọ chọrọ iji nọdụ n'ọkwa onyeisiala.

Ndị agha a kwuru uche ha na ihe onyonyo pụtara na soshal midia.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Firmain Eric Mbadinga nke BBC Afrique sị na nara ọchịchị n'ike a ndịagha mere dara ndị mmadụ n'ebube.

Na nkọwa ya, ọchịchi Bongo yiri ihe kwụ chịm, ọkachasị mgbe ozi afọ ọhụru ya pụtara.

O kwukwara na ndịagha Gabon na-akwado ezinaụlọ Bongo ọfụma, makana ọ bụ ndị nche onyeisiala, bu ndi ọtụtụ n'ime ha si mpaghara obodo Bongo ha.

Akuko ka na-ekwu na ọgbaghara ka na-ada na Libreville.

Akụkọ ga-amasị gị