Ịgụ-Arọ Enugwu-Ukwu: Igwe Ralph Ekpeh ekwuola na udo ka mma

Inyịnya ọhịa na mmemme Enugwu-Ukwu

Obu Umunri dị na be Igwe Enugwu-Ukwu bụ nke puku kwụrụ puku mmadụ gbakọtara ịgba aka ebe n'Ịgụ-Aro nke 61 Igwe Ralph Obumneme Ekpeh na-eme.

Mmemme Ịgụ-Arọ bụ mgbe Igwe Enugwu-Ukwu ji akpọkọba ndị ọ na-achị ọnụ, kpee ekpere wee malite ịgụ afọ ọhụrụ.

Igwe Ralph Ekpeh dụrụ ndị niile ochiri echichi ndụmọdụ ka ha bụrụ ndị udo ebe ọbụla ha nọ ma marakwa na Enugwu-Ukwu kwọchara aka were họta onye ọbụla echiri echichi na mmemme Ịgụ-Aro ahụ.

Aha onyonyo, Ịgụ-Arọ Enugwu-Ukwu nke 2019 bụ ọpụrụiche

Dịka osi kpọtụọ n'obu ụmụ nrị nke afọ a, Igwe Ekpeh chiri ụmụ Enugwu-Ukwu atọ nakwa mmadụ abụọ sị mba ọzọ na Naijiria echichi.

Mmadụ abụọ echiri echichi bụ Pius Okafor na Ikechukwu Agana kwuru na obị juru ha afọ na Enugwu-Ukwu chetara ha kwanyere ha ugwu dị etu a.

Ndị ọzọ echiri echichi bụ Nze Uche Nworah, Philip Obiora Nworji na Benedict Nweke Nwokolo.

Lee etu o si kpọtụọ na foto:

Ndị isi bịara ya bụ emume
Nkọwa foto, Ndị isi bịara ya bụ emume
Ndị mmadụ juputara
Nkọwa foto, Ndị mmadụ juputara
Nwaanyị e chiri echichi
Nkọwa foto, Nwaanyị e chiri echichi
Igwe mmadụ pụtara na mmemme ahụ
Nkọwa foto, Igwe mmadụ pụtara na mmemme ahụ
Nze Uche Nworah na nwunye ya bụ Uchechi
Nkọwa foto, Nze Uche Nworah na nwunye ya bụ Uchechi ka echiri ha Ezeudo Enugwu-Ukwu na Umunri na Ugomba Enugwu-Ukwu

Mmanwụ dị iche iche dịka: Ene, Police, Ijelle, Ọvụvụ nakwa mmanwụ ndị Bayelsa Steeti bịakwara na ya bụ mmemme.

Mmanwụ dị icheiche pụtakwara na ya bụ mmemme
Nkọwa foto, Mmanwụ dị icheiche pụtakwara na ya bụ mmemme
Mmanwụ ndị Enugwu-Ukwu
Nkọwa foto, Mmanwụ ndị Enugwu-Ukwu

Ndị egwu dị iche iche, otu Ọgbọ, ndị ntorobịa, ndị enyị na ikwu na ibe zukọrọ na Obu-Umunri Enugwu-Ukwu wee na-enwe aṅụrị na-afọ ọhụrụ ebidola.

E chiri Pius Okafor Ezenwa Enugwu-Ukwu
Nkọwa foto, E chiri Pius Okafor Ezenwa Enugwu-Ukwu
Ikwu na ibe zukọrọ
Nkọwa foto, Ikwu na ibe zukọrọ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị.