#FreeSamuelOgundipe: A tọhapụla onye ntaakụkọ

Samuel Ogundipe

Ebe foto si, @SamuelOgundipe

Nkọwa foto, Samuel Ogundipe banyere n'ụlọọrụ Premium Times n'afọ 2009

A tọpụrụ Ogundipe na ụtụtụ taa bụ Fraide dịka ụlọikpe nyere ndị uweojii iwu ka a tọhapụ ya.

Ọkaikpe Abdulwahab Mohammed nke ụlọikpe nta dị na Kubwa, Abuja geburu ikpe ahụ n'ụbọchị Wenezde ebe a na-enyeghị ohere ka Ogundipe nwe ọkaiwu nọchitere ya ma nye ndị uweojii ikike ijichi Ogundipe rue ụbọchị Ọgọstụ 20.

Mana n'ụlọikpe ụbọchị Fraide, oge e bulitere ikpe ahụ, Ọkaiwu Premium Times rịọrọ ka a tọhapụ ya, Ọkaikpe Mohammed gere ntị ma nye mkpebi ka Ogundipe kwụọ puku 500 ma kpọtakwa onye bi n'Abuja dịka onye ọgbaama (surety).

Cheta na ndị uweojii jichiri Ogundipe kemgbe ụbọchị Tuuzde maka ịjụ ikwupụta onye zunyere ya ụka maka akụkọ o dere.

Akụkọ ahụ gbara n'anwụ ozi onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris degara onye na-arụ dịka onyeisiala ugbua bụ Yemi Osibanjo nke mere ka a chụọ onyeisi DSS n'ọrụ maka aka o tinyere na mwakpo DSS mere ụlọomeiwu na izuụka gara aga.

Ọtụtụ Ndị Naijiria na ndị mbaụwa na-agba mbọ maka ikike dịrị onye katọrọ mwụchị na mkpọchi a kpọchiri Ogundikpe, ebe ụfọdụ mere ngaghariiwe maka ntọpụ ya.

Akụkọ ga-amasị gị