Aretha Franklin tiri "Respect" anwụọla n'afọ 76

Aretha Franklin

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na otiegwu a ma ama bụ Aretha Franklin anwụọla.

Franklin bụ onye a ma maka egwu ndị dịka "Respect" nakwa "Natural Woman" gbara afọ 76 tupu ọ nwụọ.

Ọ bụkwa nwaanyị mbụ e debanyere aha ya na ndị na-eti egwu 'Rock and Roll' a na-agaghị echefu echefu, nke Bekee kpọrọ 'Hall of Fame'.

Franklin bụ nwa ụkọchukwu ndị Baptist si obodo Detroit, ji ịgụ egwu ụka bido ma gaa n'ihu gụọ ọtụtụ egwu e ji mara ya.

Oge ọ dị ka kpakpando ya n'ịgụ egwu adịghị anwuke, o tigharịrị egwu Otis Redding bụ 'Respect', tinyekwuo ya egwu nke ya, mere ka kpakpando ya nwusie ike.

Franklin gụgharịrị egwu ahụ na-ekwu maka nwoke na-arịọ nwunye ya kwanyere ya ugwu ka o were ego kwụọ ya ụgwọ, gụọ nke ya ka ọ bụrụ nwaanyị na-anaghị arịọ biko; kama ọ na-ana naanị oke ruru ya.

Ebe Franklin Aretha na-agụ egwu n'afọ 1970
Nkọwa foto, Egwu o tiri bụ 'R-E-S-P-E-C-T' abụghị njirimara ndị 'feminist' nakwa nke ndị chọrọ ka ndị mmadụ nweta ikike ruru ha na mba Amerịka, ruo mgbe Aretha Franklin mere ya ka ọ bụrụ njirimara ha

Akwụkwọ ozi Rolling Stone kpọrọ egwu ahụ otu n'ime egwu ise kacha mma kamgbe isi mbido ụwa.

Ha kwuru: "Enweghị ihe Franklin na-ana. Ọ gụrụ egwu ahụ site n'ebe dị elu; nwaanyị na-akpọ oku ka a kwụsị ikpaso ụmụnwaanyị oke maka na ha bụ nwaanyị."

Nwaanyị mkpụrụobi

Egwu ahụ ọ gụrụ metụtara ndị mba ahụ niile, oge ebe niile tachiri atachi ka ọtụtụ niime ha na-azọ ikike ruru ha ebe afọ 1960.

Ndị isi ojii Amerịka hụtara egwu ahụ ka nkwudo megide mkpagbu nakwa inye nwaanyị ikike.

Ebe Aretha Franklin na-agụ egwu na BBC 'Top of the Pops' n'afọ 1966
Nkọwa foto, Aretha Franklin kwuru: "E cheghị m na egwu m ga-emecha bụrụ abụ nye ụmụnwaanyị. Mana ọ na-atọ m ụtọ"

"Respect" bụ otu n'ime egwu ndị Franklin gụrụ ga-adịgide ndụ.

Ndị ọzọ o tiri oge ahụ gụnyere "I Say a Little Prayer" ọ gụrụ n'afọ 1968 nakwa "(You Make Me Feel Like) A Natural Woman" ọ gụrụ n'afọ 1967.

'Ọrụ dị gara gara'

Barack Obama bụbụ onyeisiala mba Amerịka na Aretha Franklin sukọrọ aka n'afọ 2015

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Aretha Franklin mere ka anyammiri pụọ Barack Obama bụbu onyeisiala mba Amerịka n'anya oge ọ na-agụ egwu

Ọ gụrụ ọtụtụ egwu ruru isi mbido 20 n'ọgbọ 'ndị kacha agụ egwu' nke Amerịka, n'ime afọ 70.

O nwetara ihe nrite Grammy maka onye kacha egosipụta egwu R&B ugboro asatọ so ibe ya, site n'afọ 1968 ruo 1975.

Onyeisiala George W Bush nyere ya ọla nnwereonwe nke ndịisiala na-enye, n'afọ 2005.

Ọ lara ezumike nka n'afọ 2017, na-ekwu na ahụ na-eme ya "gara gara" maka ịkwụsị ịgụ egwụ.

N'ime ndụ ya, ọ rịara ọrịa ọtụtụ oge, site n'ụlọọgwụ fere n'ụlọọgwụ.