Akwamozu Ekwueme: Ndị Igbo ji eme ọnụ kwuru okwu otito

Ndị Naijiria ọnụ na-eru na okwu na otu dị icheiche gụnyere ndi ndọrọndọrọ ọchịchị, ndị ọrụ ugbo, ndị na-azụ ahịa,ụmụ akwụkwọ nakwa ọtụtụ ndị mmadụ yi uwe eji mara ha kpakọrọ n' Ekwueme Square, dị n' Ọka (Awka) ma naa-ekwupụta ezi ihe Chief Alex Ekwueme mere ka ọ dị ndụ.
E si Enugwu buru ozu Ekwueme bata n'ogige ahụ ebe uwe ojii mere ya ịkwụ na ahịrị ikpeazụ.
Onye ntaakụkọ BBC bụ Ebere Ekeopara gara ebe ahụ jụrụ ndị mmadụ ihe mere Ekwueme jiri bụrụ ọpụrụiche.
Nnia Nwodo, onyeisiOhanaeze Ndigbo:

Chief Nnia Nwodo bu Onye isi otu jikotara ndi Igbo nile bụ, Ohaneze Ndigbo, kwuru na Chief Alex Ekwueme enweghị oyiri n' umeala, idi uchu na oru ma bụrụkwa onye eziokwu.
Nwodo kwuru okwu a oge ndi agbata ndị ọwụwa anayanwụ jikoro aka ọnụ wee guzobe mmemme iji si Ekwueme gaa nke oma.
Chief Ken Nnamani:
Onye jibu okwa onyeisi Sineti n'ala Naijiria bụ Chief Ken Nnamani nyere ndị ala anyi ndumọdụ ka ha ṅomie ezi agwa Dr Alex Ekwueme nke mere ka puku kwuru puku mmadụ jiri gbakọ na Ekwueme Square taata(Tọsde) mmemme nkwanye ugwu na Ekwueme Square Awka.
Ọ sịrị,"Onweghị ebe a na-akpọ ya na o riri ego."
Nnamani toro Ekwueme dịka nka nna restructuring nakwa zoned federalism.









