Billy Graham anwụọla

Ebe foto si, Getty Images
Billy Graham, onye amama n'izi sa ozi ọma nke Christ anwụọla.
Ọ bụ onye na-ekwuchitere Ezinụlọ ya kwuru nke a.
Graham dị arọ iri itoolu na itoolu wee nwuọo.
Ọ nwụrụ na be ya n'ụtụtụ a.
Dika onye mgbasa ozi Christ na America,Graham so na ndị ama ama gbapụtara mgbasa ozi nke Christ na Mba ahụ.
Onye mgbasa ozi a bidoro nzụkọ nchegharị na arọ 1940 we mecha bụrụ onye ndụmọdụ ndị isi mba dị iche iche.



























