Biafra: Ebonyi chọrọ nke puruiche - Odeakwụkwọ gọvanọ Umahi

Aha onyonyo, Onwere ụdị Biafra ndị Ebonyi chọrọ

Onye odeakwụkwọ mgbasa ozi gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Emmanuel Uzo ekwuola na onweghi mgbe gọvanọ Umahi sị na Ebonyi Steeti esoghi na Biafra.

O kwuru nke a n'ajụjụ BBC Igbo gbara maka iji katọọ akụkọ na-ekwu na gọvanọ Umahi sị na Ebonyi Steeti esoghi na Biafra.

O kwuru na ụdị Biafra nke ndị Ebonyi Steeti chọrọ bụ nke ga-akwụrụ onwe ya n'ihe banyere akụnaụba, inyere ndụ aka na nwulite obodo.

O kwuru na ọ bụrụ ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ ga-agbakọta aka ọnụ ma rụọ Steeti ha, na nke a pụtara na Biafra erutela ndị Igbo aka.

Dave Umahi

Ebe foto si, EBONYI GOVERNMENT

Uzo kwuru na ndị ntaakụkọ dere na Ebonyi Steeti esoghi na Biafra aghọtaghị ihe gọvanọ Umahi kwuru nke ọma.

N'ajụjụ banyere okwu ịtọrọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ, Emmanuel Uzo kwuru na onweghi mgbe gọvanọ Umahi kpọrọ ndị Ipob aha maka iyi egwu ahụ.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na gọvanọ Umahi nwetere ụdị ozi ahụ mana o sighi n'aka ndị Ipob bịa kama na nyocha ka na-aga n'ihu ebe ozi ahụ si bịa.

Biafran Flag

Ebe foto si, Getty Images

N'aka nke ọzọ ọnụ na-ekwuru Ipob n'Abuja bụ Ụkọchukwu Peace ekwuola na ozi dị etu ahụ esighi n'aka Ipob bịa.

Ụkọchukwu Peace kwuru na e be gọvanọ Umahi ejirila ọnụ ya kwuo na aka Ipob adịghị na ya bụ ozi na nke pụtara na aka ha dị ọcha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: