PDP Rally: Ihe mere anyị agaghị ọsọ achụmnta vootu PDP - Umahi

Gọvanọ David Umahi

Ebe foto si, Ebonyi State Government

Onye ndu ndị gọvanọ mpaghara ọwụwanyanwụ bụ Dave Umahi ekwuola na ọ bụ maka a na-eme ọsọ achụmnta vootu a na mpaghara na mpaghara mere na ahụghị ndị gọvanọ PDP si mpaghara ọwụwa anyanwụ na ọsọ achumta vootu PDP mere na ugwu na ndịda anyanwụ Naijiria.

Umahi kwuru na ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ na-akwado maka nke PDP ga-eme na mpaghara ọwụwanyanwụ bụ ebe ha ga-apụta n'ebube ha.

Ugboro abụọ PDP mere mkpatụ achụnta vootu maka ọkwa onyeisiala n'aha Atiku Abubakar na Peter Obi ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na ndị welitere isi na pati ahụ, agaghị ya.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ

Umahi kwuru nke a site n'ọnụ onye odeakwụkwọ mgbasaozi ya bụ Emmanuel Uzo bụ onye gwara BBC Igbo nke a.

Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ndu PDP mpaghara ọwụwanyanwụ na-akwado Atiku na Obi n'ịzọ ọkwa onyeisiala na osote ya.

Aha onyonyo, Ihe mere anyị agaghị ọsọ achụmnta vootu PDP

Uzo kwuru na ọ bụ n'Enugwu ka a ga-eme ọsọ achụmnta vootu ndị PDP nke mpaghara ọwụwaanyanwụ kama na e hibeghi ụbọchị ọ ga-abụ.

Atiku, Obi, Secondus, Saraki na Melaye

Ebe foto si, @OfficialPDPNig

PDP agbara ọsọ nta vootu maka mpaghara ugwu Naịjirịa na Sokoto Steeti n'ụbọchị Monde nakwa mpaghara ndịda anyanwụ n'Ibadan dị n'Oyo Steeti n'ụbọchị Tọsde.

Atiku

Ebe foto si, @OfficialPDPNig

N'ime ọsọ achụnta vootu abụọ ndị a, onweghi onye ndu PDP si na mpaghara ọwụwanyanwụ so n'ime ha n'agbanyeghi na Peter Obi bụ onye na-azọkwa osote onyeisiala.

Nke a ebutele oke arụmaụka n'etiti ndị mmadụ banyere ịdị n'otu ndị PDP na nkwado ndị ndu si mpaghara ọwụwanya n'ebe Atiku na Obi nọ.