Peter Obi na ndị gọv Alaigbo: Ụmụ Igbo kwadoro ihe Atiku mere

Ebe foto si, Getty/Dave Umahi
Dịka akụkọ pụtara na-egosi na obi adịghị ndị gọvanọ PDP n'ọwụwa anyanwụ nakwa ndị ndu ha na mpaghara ahụ mma maka nhọrọ Atiku Abubakar họrọ Peter Obi dịka osote ya n'ịzọ ọkwa n'2019, ọtụtụ ụmụ afọ Igbo nakwa ndị Naijiria ndị ọzọ dọnyere Obi ukwu.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu uche gbasara ihe ndị Gọvanọ PDP n'Ala Igbo na-ekwu maka nhọpụta Atiku Abubakar họpụtara Peter Obi sị na ọ bụ uche aka ha, na ọ bụghị uche Ndigbo.
Cheta na David Umahi bụ gọvanọ Ebonyi steeti mabụrụkwa onyeisioche 'South East Governors' Forum', kwuru na nhọrọ Atiku họpụta Peter Obi bụ 'imenye Ndigbọ ihere n'ihu' n'ihi na 'akpaghị ya akpa'.
Ha nụrụ iyi na ha ga-agba ya mgba okpuru maka ịgbakụta nkwekọrịta ha nwere azụ.
Otu onye a chọghị ka a kpọ aha ya nọ n'ọgbakọ ha mere gwara ụlọ ntaakụkọ Sun na mkpebi ha nwere bụ ka Atiku were onye chịbụrụ ụlọakụ etiti bụ CBN n'aha ịchafụ bụ Charles Soludo.
Onye ahụ sịrị, "Udo karịrị ịdị ma ọ bụrụ na ọ họrọ Soludo nihi na ọ bụ ka anyị kwekọrịtara."
Kepukepu ọzọ na-eru BBC Igbo nti na-ekwu na-enwere ọtụtụ nọ na PDP ọwụwa anyanwụ anya ha dị n'ọkwa e nyere Peter Obi.
Uche ọha Igbo
Mana ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu ndị gọvanọ PDP na-ekwu abụghị uche Ndigbo kama ọ bụ nke onwe n'ihi na obi dị Ndigbo mma na ihe Atiku mere.
Onyeisi ndị ntorobịa otu Ohaneze bụ Mazi Okechukwu Isiguzo dụrụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ọdụ ka ha hapụ ịchụ mmasị onwe ha, chụwa ọdịmma Ndigbo.
Otu ọkaiwu mabụrụ onye ọnụ na-eru n'okwu gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Chima Nnaji tụnyere n'okwu ahụ oge BBC Igbo gbara ya ajụjụ ọnụ gbasara okwu Atiku na Peter Obi."Ndị Igbo ekwesighi ị na-alụ ọgụ n'ime onwe ha" bụ ihe
Nnaji kwuru na ọ bụ ihe bu obodo a n'isi ya mere na ha kwesiri ịkwado onye nke ha iji nọchị anya ha n'ihe gbasara ọchịchị.
O kwukwara na Ndigbo ghara iji aka ha "kụwa efere Chineke nyere ha jiri rie nrị" agbanyeghị ihe ọbụla Peter Obi mere ha bụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ.
Lee ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ekwu:
Ọtụtụ ndị mmadụ ọkachasị Ndigbo na-egosi obi ụtọ nke ha kwupụtara na igwe okwu Facebook.
Mubowale Kuforiji, Dozie Umekunie nakwa Nomso Muoka dere na Peter Obi bu onye kachasị mma n'ime ha niile.

Ebe foto si, Facebook
Ndị ozọ dịka Goddy Uwazurike nakwa Basil Olemerezi sokwa na ebumnuche ndị anyi kpọrọ na mbu.

Ebe foto si, Augustine Avwode Facebook
Pius Mordi dere na onweghị onye kwesiri ịge ntị n'ihe Umahi na ndị otu ya na-ekwu.

Ebe foto si, Pius Mordi facebook
Akụkọ ndị ga-amasị gị












