Ụbịam: Ebonyi gbara ndị nke atọ n'ime Naịjirịa niile

UNDP na Naịjirịa
Nkọwa foto, Ezenwaanyị Breten kpọrọ Naịjirịa dịka mba ụbịam rụrụ ụlọ mgbe ọ gara Sọt Afrika

Ihe nchọpụta United Nations Development Programme (UNDP) biputara na Ọktoba 2018 gosiri na ọnụọgụ na-egosi ka ụbịam sị kwuru na steeti dịcha na Naịjirịa adịghị mma n'Ebonyi steeti.

Ka ihe siri kwuru ugbua bụ n'ọnụọgụ eji amata ka ogbenye siri dị na obodo a na-egosi na ihe ruru mmadụ pasenti 53.7 dara ogbenye na Naịjirịa.

Nke a pụtara na naanị mmadụ dị parsent 47.3 na ahụ nri ọnụ kwa daa na obodo a.

Nke kacha metụta ndị Igbo bụ n'Ebonyi steeti ketakwara oke na ya bụ ụbịam dara Naịjirịa.

Ya bụ ihe nchọpụta na-egosi n'Ebonyi steeti ketere oke dị pesenti 58.9 dịka otu n'ime steeti anọ ụbịam bịakwutere ọrịrị na Naịjirịa.

Nke a pụtara na ihe karịrị ọkara mmadụ daara ogbenye n'Ebonyi steeti.

Ndị ha na ha na-azọ ọgbọ n'ụbịam bụ Sokoto 89.9%, Jigawa 86.1%, nakwa Rivers 58.9%.

Kedụ ihe ndị agbakọrọ were nwete ọnụọgụ a?

Ihe agbakọrọ ejiri nwete ọnụọgụ a abụchaghị ka ego si abata n'obodo, maọbụ ka ndị mmadụ sị enwe ọṅụ, kama ọ gụnyere ihe nsehechiazụ nke na-eme na mmadụ enweghị ike ibi ndụ ya n'ụjụ ka okwesiri.

Ụbịam abụghị naanị ezigbo ụzọ, mmiri, ụlọ na ihe ndị ọzọ, mana ọ gụnyere ezi ahụike na nrị zuru oke na-enye ihe achọrọ n'ahụ.

Ihe ndị ọzọ gosiri ụbịam sọ na ya bụ ọnụ ọgụgụ bụ itibọrịbọ (agaghị akwụkwọ), enweghị aka ọrụ, ụkọ na ihe ụfọdụ eji ebindụ, ebighị ezigbo ụlọ, enweghị ezigbo ọrụ nakwa ịkpa oke n'ezi nakwa ezinaụlọ.

Nwafọ Ebonyi steeti bụ Abigail Ezeiheukwumere kwetere na n'ezie "ụbịam dị na steeti anyị nke bụ na ọtụtụ anaghị ahụ tụtụrụ racha, ọkachasị n'ime obodo".

Ọ sịkwa na gọmentị Ebonyi steeti na-eme ihe niile onwere ike iweputa Ebonyi n'ọnụ ọgụgụ ụbịam a.

Akụkọ ga-amasị gị