Donald Duke: Ibi ego na China, ofesi ga-akpụ Naịjirịa isi eru eru

Donald Duke

Ebe foto si, @Donald_Duke

Nkọwa foto, Donald Duke chịburu Krọs Riva steeti n'aha otu SDP

Donald Duke bụ onye bu ọkọrọtọ ndị otu SDP na ntuliaka 2019 adọọla aka na ntị maka oke ụgwọ Naịjirịa na-ekonye onwe ya n'isi site mba China.

Duke onye kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịta ụbụbọ n'isi ụlọọrụ pati ha n'Abuja

Ọ sịrị na oke ọmụrụnwa nke ruru pasent 30 Naijiria na-akwụ n'isi ụgwọ e ji mba China na mba ndị ọzọ emela ka achụmntaegọ siwanye ike na Naịjirịa.

N'otu aka ahụ, ọkammụta na ihe gbasara akụnaụba na mahadum, 'Lagos Business School,' bụ Bongo Adi kwuru na China ji ego mbibi eke mba dị n'Afrịka agbụ.

'Ndị China na eji ego mbibi ego eke mba dị iche iche'

Aha nkeananụānụ, Bongo Adi: Mbibi ego n'aka China ga-eke Naijiria agbụ

Ọ tụrụ arịrị na Naijirịa adabawakwala n'ọnọdụ iji ụgwọ nwafọ Igbo bụ Ngozi Okonjo Iweala nyere aka hụ na a gbapụtara Naijiria.

Adi kwuru na gọọmenti na-ebi ego aghara aghara n'aka China na obodo ndị ọzọ adịghị mma.

O ji mba Zambia ebe ndị China weghara ọdọụgbọelu na nakwa ụlọọrụ na-emepụta ọkụ latrik nakwa and mba Congo ebe ha na-adọrọ Naijiria aka na ntị.

Adi gbara ama na mba ruru 18 nọ na nnukwu agbụ na obi mmapụ n'ihi nsogbu oke ụgwọ ha jị China nke ọ kpọrọ 'Chinko imperialism' nke ọ kọweara bụ ijiigbanye bibi na-eke mba agbụ.

Yuan

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ mụrụnwa ego Naijiria birila China bụ pasent 30

'E ji pasent 70 eretara na mmanụ agbịdị akwụ ụgwọ anyị ji, ihe fọziri e ji arụ ọrụ bụ pasent 30."

"China ji aghụghọ abịa n'Afrika na-aghọgbu ndị ọchịchị nchịgbu."

´Ụmụ ndị anamụbeghị amụ ejidela ndị China ụgwọ."

Akụkọ ga-amasị gị: