Imo APC Primaries: A kpọpụtala Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo

Uche Nwosu

Ebe foto si, @Honuchenwosu.JP

Nkọwa foto, Uche Nwosu bụ onyeisi ndị ọrụ na Imo steeti
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

A kpopụla ọgọ Rọchas Okorocha bụ Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha APC n'afọ 2019.

Onyeisioche kọmịtị na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ bụ Bigadia-Generalụ Ibrahim Agbabiaka bụ onye kwupụtara nke a kwuru Nwosu nwetara vootu kachasị na ntuliaka o jiri merịa mmadụ asatọ ndị ọzọ zọrọ ọkwa ahụ.

Na ịnabata mkpọpụta ahụ, Nwosu kelere APC Imo were kwuo na ihe ọzọ fọdụrụ bụ inweta mmeri na ntuliaka izugbe ga-eme na 2019.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post