Imo APC Primaries: A kpọpụtala Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo

Ebe foto si, @Honuchenwosu.JP
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
A kpopụla ọgọ Rọchas Okorocha bụ Uche Nwosu dịka onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Imo steeti n'aha APC n'afọ 2019.
Onyeisioche kọmịtị na-ahụ maka ntuliaka imeụlọ bụ Bigadia-Generalụ Ibrahim Agbabiaka bụ onye kwupụtara nke a kwuru Nwosu nwetara vootu kachasị na ntuliaka o jiri merịa mmadụ asatọ ndị ọzọ zọrọ ọkwa ahụ.
Na ịnabata mkpọpụta ahụ, Nwosu kelere APC Imo were kwuo na ihe ọzọ fọdụrụ bụ inweta mmeri na ntuliaka izugbe ga-eme na 2019.
Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?
Warning: Third party content may contain advertsEdemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post


























