Bakare: 'Tụnyere naanị onye ga-eme nhazigharị Naijiria'

Tunde Bakare

Ebe foto si, Getty

Nkọwa foto, Tunde Bakare sobu Onyeisiala Buhari zọọ ọkwa onyeisiala dịka osote ya na 2011

Pastọ Tunde Bakare, onyeisi ụka Latter Rain Assembly, kpọrọ oku ka ụmụ Naijiria tụnyere naanị onye ga-ahazigharị Naijiria nke a kpọrọ 'restructuring' na Bekee.

Bakare kwuru nke a na nsonso ka ọ na-ezi ozi maka ncheta nnwereonwe Naijiria n'ụlọụka ya na Legọs.

Ọ dụrụ ndị Naijiria ọdụ ka ha zere ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekwubu maka nhazighari mana ha agbanwela ọnụ ha dịka ha banyere n'ọkwa ọchịchị ma na-ekwe nkwa ya ọzọ dịka a na-akwado ntuliaka ọzọ.

O sịrị, "O were m anya na oge eruola oge anyị ga eme nhazigharị.

"N'etiti ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, enwere etu ọtụtụ sị ahụta oku a na-akpọ ka enwe nhazigharị.

" E nwere ndị na-akpobu okwu a mana ha agbanwela ọnụ okwu ha n'ihi na ha nọ n'ọkwa ọchịchị.

"Ha echezọla na ọkwa ha agaghị adịgide.

"Ndị nọ n'ọkwa achọghị nhazigharị, n'ihi nna ha anaghị eche Naijiria ga-eru oge agaghị nwekwa ego a na-ereta na mmanụ agịdị.

"Ha na-egbu oge ha n'ihi na ihe rue oge ya o mee."

Ọ katọrọ Ntuliaka Gọvanọ Osun

Bakare gara n'ihu katọọ ihe Inec mere na ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere n' Osun steeti.

Akụkọ ga-amasị gị