Ndị Abịa: Gọọmentị bịa doziere anyị okporoụzọ Okigwe-Umuahia gbabiri abụọ
Ndị njem nakwa ndị obodo gbara Isikwuato gburugburu ebekuola goomenti etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka dịka ụzọ nke abụọ si Okigwe gawa Enugwu gbabiri abụọ n'obodo Akara dị n'Abịa steeti.
Ọdachi a mere na nsonso dịka oke mmiri ozuzo butere oke idemmiri kpara mkpamkpa n'ebe ahụ.
Otu onye obodo ahu bu Joseph Odinuko gwara BBC na o bu oke mmiri ozuzu nakwa elezighị anya butere mgbabi okporoụzọ ahu a mara dika 'ABSU-Akara Road'
"Kemgbe Ochichi Ndubisi Kalu, o nweghi ihe obula e mere n'ụzọ a."

Na nkọwa ya, otu onyeisi na ministri na-ahu maka gburugburu n' Abia state bu Thomas Okoro kwuru na odachi ahu karịrị goomenti steeti ahu aka.
Na nsonso a, oke idemmiri so mmiri ozuzu emebiela ọtụtụ ihe n'obodo dị iche iche na steeti dị na mpgahara ọwụwa anyanwụ gunyere Anambara nakwa Abịa steeti.
Akụkọ ga-amasị gị:






