Okporoụzọ Umunya n'Anambara enweghị oyiri n'ịjọ njọ

Ụzo Ụmụnya

Onye ọbụla si Ọka na-aga Ọnịcha na-achịrị obi n'aka ịgafe Ọkụzụ wee banye Ụmụnya.

Ya bụ ụzọ awara awara sitere n'Enugwu-Ọka were na-aga Ọnịcha, bụ nke mere nnukwu mmebi n'Ụmụnya.

Ngwa ngwa ị gafechara Ukpo na Dunukọfịa, ya bụ ajọ ụzọ bidoro n'Ọkụzụ wee kwụsị n'Ụmụnya.

Ndị anyị gbara ajụjụọnụ tiri mkpu sị na ọ dị ka gọọmentị echefuru ụzọ ahụ echefu kamgbe ihe karịrị afọ isii.

Ụzọ ọjọọ Ụmụnya

Otu onye na-agba ọgbatumtum kwuru sị "ha bịa rụọrọ anyị ụzọ. Ha bịa hụ ahụhụ anyị na-ata...Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla maka ụzọ a.

"Otebeghi aka ụgbọala bu ehi gburu mmadụ n'otu ụzọ a. Ihe ruru mmadụ 18 nwụrụ na ya bụ ihe mberede."

N'otu ebe ahụ ụzọ mebiri ka ụmụ akwụkwọ ji otu afọ efe ala nna ha bụ NYSC nwere ogige a kpọrọ "Orientation Camp".

Ụzọ e si aga n'ama NYSC n'Ụmụnya

Nchọpụta gosiri na ọtụtụ ihe mberede nke okporoụzọ ahụ alaala ọtụtụ ndụ na akụnaụba ndị mmadụ n'iyi.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: