Ị ma na "selfie" nwere ike isete ọnwụ?

Ebe foto si, Getty Images
Ị na-akwado ise onwe gị foto nke Bekee kpọrọ 'selfie?' Gbazie anya, ka ị ghara isi n'ọṅụ fere n'ọnwụ.
Nchọpụta nke 'All India Institute of Medical Sciences', otu jikọrọ ụlọaakwụkwọ ahụike na mba Indịa, mere, ekwuola na mmadụ ruru 259 anwụola na mbaụwa oge ha na-ese onwe ha foto n'afọ isi gara aga.
Nchopụta nke e depụtara n'akwụkwọ a kpọrọ Journal of Family Medicine and Primary Care, ndị nwụrụ ebe ha na-ese onwe ha foto karịrị na mba Indịa, ebe Russia,US nakwa Pakistan na-eso ha.
Ụfọdụ bụ ndị mmiri gbagburu, ụfọdụ bụ ndị nwụrụ na njem, ebe ụfọdụ dakpuru ọkụ maọbụ si n'oke elu daa.

Ebe foto si, Getty Images
Mana ụdị akụkọ a abụghị ihe ọhụrụ n'ebe ụmụ Naijiria nọ, dịka ụfọdụ ụmụafọ ala a sọ n'ọtụtụ nwụrụla dịka ha na-ese onwe ha foto.
Lee ugboro iri mmadụ zutere ọnwụ dịka ọ na-ese onwe ha foto na nsonso a:
1. Mmiri riri otu onye ji otu afọ efe ala Naịjirịa na Bayelsa
N' ọnwa Mee afọ a(2018), otu onye ji otu afọ efe ala Naijiria amaghị aha ya danyere na mmiri, mmiri rie ya dịka ọ na-ese onwe ya foto ọ ga-eji na-echeta ife ala nna.
Ọdachi a mere n' Ogbolomaibiri, Nembe dị na Bayelsa steeti oge nwa amadị a onye nọ nelụ ụgbọmmiri a na-akpọ Jetty mịchapụrụ danye na mmiri oge ọ chọrọ ise onwe ya foto.
2. Ụmụ akwụkwọ mahadum Ondo abụọ nwụrụ oge ha na-ese onwe ha foto n'ime ụgbọmmiri
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Olabiyi Emmanuel na Olokun Babatunde Alex bụ ụmụakwụkwọ Federal University of Technology, Akure(FUTA ), Ondo steeti nwụrụ ka ha banyere n'ụgbọmmiri dị na mmiri mahadum ahụ na-azụ azụ dị nso ebe ha gara ọgbakọ nkuzi ọrụaka.
Ha dị mmadụ anọ banyere ụgbọ ahụ, mana abụọ sọtara onwe ha mgbe ụgbọmmiri ahụ gburu.
3. Otu nwoke Indịa nwụrụ ka ọ na-ese onwe ya na anụọhịa a kpọrọ 'bear' foto
Nke a mere na agbanyeghị na ndị enyi ya dọrọ ya aka na ntị ka ọ ghara ise ya bụ foto.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
4. Nwaanyị Bangkok nwụrụ nokporo ụgbọoloko

Ebe foto si, LILLIAN SUWANRUMPHA
Nke mere oge ya na enyi ya nwaanyị na-ese onwe ha foto n'okporo ụgbọọloko na amagị na ụgbọ na-abịa.
Ụgbo ahụ gbujiri ya ụkwụ , omecha nwụ n'ụlọọgwụ, ebe enyị ya nwoke merụrụ nnukwu ahụ.
Anụ ọhịa bear merụrụ ahụ tagburu nwoke ahụ oge ọ gara ya nso ise ya foto na agbanyeghị na ndị enyị dọrọ ya aka na ntị.
5. N'ọnwa Septemba, nwa dị afọ 18 nwụrụ ka ọ dara site n'elu Nevanda Fall
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Nne nwata ahụ kwuru na ọ chọrọ ise onwe ya foto na mmiri ahụ dị n'ogige Yosemite National Park dị n'ala Amerịka.
6. Mmiri riri ụmụagbọghọ Sri Lanka abụọ bi n' Oman ka ha na-ese onwe ha foto
Ụmụada nwụrụ ka ha chọrọ ise foto na mmiri ọgbanaeleu dị na Salalah, Oman.
7. Ụmụnne abụọ ndị Indịa nwụrụ ka ha na-ese onwe ha foto na nso okporo ụgbọoloko
Nke a mere n'ọnwa Ọgọstụ, afọ 2018.
8. Ndị amaala Canada atọ nwụrụ ka ha dagburu mmiri

Ebe foto si, Mindythelion/Instagram
Mmiri buru Megan Scraper, onye a ma ama na Youtube maka ise ihe nkiri njem nlegharị anya na nso mmiri ọgbanelu dị na British Columbia.
Isi Ryker Gamble na Alexey Lyakh bụ enyi Megan nakwa ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ soro ya dịka ha chọrọ ịzọbụta Megan.
9. Nwaagbọghọ Nu Ziland dagburu mmiri ka o sechara onwe ya foto
Nke mere na Canada oge ya nwaanyị aha ya bụ Danni Hogan na enyi ya nwoke na-aga njem nleghari anya n'ọnwa ọgụst 2018.
10. Onye China nwụrụ na mba Indonesia ka ọ danyere mmiri ebe ọ na-ese onwe ya foto
Nke a mere na Nusa Lembongan dị na Bali, Indonesia.









