Anambra Flood: Nwaanyị amụọla ụmụ ejima n'ụlọ gbatagbata

Ụmụ ejima

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Idemmiri a achụpụla ndị mmadụ na be ha na steeti kariri anọ na Naịjirịa

Ka ndị mmadụ ọkachasi ndị bi na steeti dika Anambara so n'ebe idemmiri na-akpa mkpamkpa ugbua na-eche ka mmiri taa, ihe ọṅụ emeela.

Otu nwaanyị akpọrọ oriaku Obiora amụọla ụmụ ejima n'ụlọ ebe ndị gbatagbata kpọsara ndị idemmiri chụpụrụ n'Ogbaru dị n'Anambara steeti.

Nwaanyi a mụrụ ụmụ ejima a ụbọchị September 20, bụ onye obodo Umuezeoma.

Onyeisi okpuru ọchịchị Ogbaru bụ Arinzechukwu Awogu, kwuru na nwaanyị ahụ mụrụ ejima nwoke na nwaanyị.

O kwuru: "Ọ bụ eziokwu na otu nwaanyị mụrụ nwaanyị ebe a, gọọmentị akpọpụla ha n'ụlọ gbatagbata kpọga ha ụlọọgwụ maka ezigbo nleta."

Arinzechukwu kwukwara na o nwere nwata nwaanyị dị afọ itoolu nwụrụ maka ihe mberede idemmiri a.

Aha onyonyo, Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.

Gọọmentị Anambra ekwuola na ọ ga-eme ihe ọbụla o nwereike ime iji hụ na ha wetere ihe enyemaka a na-enye ndị idemmiri chụpụrụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: