Ọnọdụ ndị idemmiri metụtara n'Anambra steeti nọ

Aha onyonyo, Idemmiri achụpụla ndị Ogbarụ, Anambra Steeti n'ụlọ ha.

Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi n'Anambara steeti bụ Don Adinuba ekwuola na otu onye ụkọchukwu ụka Katolik anwụọla n'idemmiri na-eme n'Anambara steeti.

Eze kwuru nke a oge ọ gwara BBC igbo okwu n'ekwenti.

O kwuru n'ihe a bụ ihe ịgba anya mmiri nke ha na-agba mbọ ma na-arịọkwa ka Chukwu nyere ha aka.

Ọ kọwara na ọnwụ ụkọchukwu ahụ bụ maka na ọ chọrọ ịzọ enyi ya nwoke ndụ, wee nye ya uwe ndụ e ji aba na mmiri oge ha na-eme njem si Ọnịcha na-aga Inoma.

Ụkọchukwu ahụ onye ọ kpọrọ Fada Francis Ebere bụ ụkọchukwu nọ n'ụlọụka St. Jude Thaddeus Catholic Church, Inoma.

Eze kwuru n'ọnwụ ahụ bụ nnukwu ihe mwute nye steeti ahụ mana ha na-eme ihe niile dị ha n'ike iji hụ na ndị o metụtara nwere ihe kwesiri iji nyere ndụ ha aka.

Mana ọtụtụ ndị bi n'Ọgbarụ na akụkụ ebe ndị ọzọ dị n'Odekpe, Ọnịcha ebeela akwa arịrị na ebe gọọmenti steeti ha wepụtara ka ha nọrọ maka idemmiri ahụ enweghi ihe ha ji enyere ndụ aka nọ ya.

Ebe gọọmenti wepụtara
Nkọwa foto, Ndị ọdachi idemmiri metụtụtara n'Ogbaru na-arahụ n'ute, ha enweghi akwa n'ebe gọọmenti wepụtara ha

Ụfọdụ n'ime ha gwara BBC Igbo okwu kwuru n'ebe ndị ahụ enweghi ebe ndina, onweghi ebe a na-esi nri, onweghi ezi mmiri nakwa ihe ndị ọzọ.

BBC Igbo jụrụ kọmịshọna na-ahụ maka gburugburu n'Anambara steeti bụ Michael Okonkwo maka nsogbu ahụ ndị mmadụ kwuru na ha na-enwe.

Mana Okonkwo kwuru na ya ga-aga ebe Ọgbarụ gaa hụ na ego ndị gọọmenti wepụtara iji hazie ndụ ndị ọdachi a metụtara na-aba ebe ndị o kwesiri ịba.

N'okwu ya; "E wpụara ego nye ndị a mana i ma ihe dị na gọọmenti, i nwere ike wepụta ego mana ha anaghị abịa."

Okonkwo kwuru na ha na-arịọ ndị ahụ mana ama ọkwa ka ha were ego ahụ mana ndị ihe a metụtara agwaghị BBC Igbo maka ego ọbụla.

Cheta na osote onyeisiala Naịjirịa bụ `Yemi Osibanjo gara Anambara ụnyaahụ ebe ọ gwara ndị ọrụ Nema ka ha gbaa mbọ hụ na ndị ọdachi na-emetụta nwetara ihe ruru ha.

Ndị ọdachi a metụtara

Mgbe BBC Igbo kpọtụrụ onyeisi ụlọọrụ NEMA bụ Mustapha Maihaja n'ekwenti, O kwuru na ụlọọrụ ha a malitela i zi ga ngwa ndị eji bị ndụ n'ogbe ebe ihe ndị a metụtara kamgbe abalị iri na asaa nke ọnwa Seputemba.

O kwuru na ha na gọọmenti Anambara Steeti na-agbakọ aka ọnụ iji hụ na ebupụrụ ndị mmadụ n'ogbe ebe ihe ndị a metụtara.

Maihaja kwuru na ihe a bụ ihe a na-eji nwayọ ahazi, na ọ bụ ya mere ọ dịka onweghi ihe na-eme, kama na dịka ọ dị ugbua, na e zigala nri, mmiri na ihe ndị ọzọ n'ogbe ndị ahụ.

Ọ gakwara n'ihu kwuo na gọọmentị na ụlọọrụ ha etinyela isi na Steeti ndị ọzọ dị na mpaghara ọwụwanya bụ ebe idemmiri a metụtara.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: