Etu idemmiri siri gbuo nwata n'Anambara steeti
Gọọmentị Anambara steeti ekwuola na idemmiri bụrụ otu nwata n'obodo Nibo dị na steeti ahụ bụ 'ndajọ mmadụ.'
Kọmịshọna Anambara steeti na-ahụ maka gburugburu bụ Michael Okonkwo kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere n'ekwenti.
Ụbọchị Wenezde, otu nwata dị afọ 13 aha ya bụ Ebube Samuel nwụrụ ka ụgbọala bu ya na mmadụ atọ ndị ọzọ dakpuru n'idemmiri so oke mmiri ozuzo.
Dịka ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Haruna Mohammed siri kọwara BBC Igbo ọdachi a mere n'okporoụzọ Nise na nso City Landmark Hotel Amaọbịa (azụ ụlọ gọvanọ) dị n'okpuru ọchịchị Ọka-Saụtụ.
Mohammed nyekwara aha ndị atọ ndọ ọzọ ndị nọ n'ụgbọ ahụ dịkaEjike Anadebe bụ onye kwọugbọala ahụ, Ogu Ebuka nakwa Emmanuel Samuel.
Akụkọ kwuru na nwata ahụ nọrọ na mmiri elekere anọ tupụ a zọpụta ya ma o mechara buga ya ụlọọgwụ, nwụọ ebe dọkịta kwurru na ọ nwụọla.
Nke a na-eme na erughị otu izuụka gọọmenti Anambara steeti kwuru na ha dị njikere igbochi nsogbu oke idemmiri na steeti ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mana Okonkwo tara onye ọkwọụgbọala kwọ nwata ahụ na ndị ọzọ oge ihe mere ụta sị na o geghị ndụmọdụ ndị mmadụ ntị.
"Onye ọkwọụgbọala hụrụ na mmiri na-aga, ndị mmadụ na-asị ya agala, ọ gaa, mmiri wee rie nwata ahụ."
O kwukwara na ihe butere oke idemmiri na mpaghara ahụ, "bụ ọwammiri aja gbajuchara nke meere ka mmiri tofee ikperemmiri."
Okonkwo onye kwuru na ọdachi ahụ wutere gọvanọ steeti ahụ bụ Willie Obianọ kwuru na steeti ahụ akwadochaala ọrụ ikpocha aja juru n'ọwa mmiri ahụ nke meere na mmiri na-asofe ikperemmmiri oge ọbụla e nwere oke mmiri ozuzo.
Ọ gara n'ihu rịọ ndị mmadụ ka ha kwụsị itufu ahịhịa ebe ọbula, ka ha kpochaa ọwa mmiri dị ha nso.
Cheta n'izu ole na ole gara aga, otu nọrọ onwe ha a kpọrọ 'Igbo Environmental Foundation' kwuru na mpaghara ọwụwa-anyanwụ nwere mbize karịrị puku abụọ na narị asatọ nke nwere ike ịchụsa obodo dị iche iche na mpaghara ahụ.











