ICG: Ndị ọchịehi akpaala ike ugboro isii karịa Boko Haram

Ndị na-agbapụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị mmadụ buru ngwongwo ha agbapụ n'obodo ha ka ndị ọchịehi gburu ihe ruru mmadụ 200 na Jos

Ndekọ ọhụrụ apụtala ebe ndị otu na-ahụ maka ọgbaghara na mbaụwa a na-akpọ 'International Crisi Group (ICG)' na Bekee tiri mkpu na ndị ọchịehi egbuola mmadụ karịa ka Boko Haram gburula.

Nke a bụ agbanyeghi na Boko Haram bụ ndị a ma ama na mbaụwa dịka ndị na-eyi egwu, ha achịtaghị aja ebe ndị ọchịehi nọ maka na ndị ọchịehi egbuola karịa ha ugboro isii n'afọ a.

N'akwụkwọ ahụ ha bipụtara na webusaịtị ha, ha kwuru na ndị ọchịehi egbuola mmadụ 1,300 kemgbe ọnwa Jenuwarị afọ a.

Ha kọwara na kama ogbugbu ndị ọchịehi na-emebu na-akwadoghị akwado, ha na-ejizi anya ọcha kpaa nkata pụrụ iche etu ha si ekpochapụ obodo na ala ndị mmadụ.

Akwụkwọ ahụ kwukwara na mbụ ọ na-abụ mkparị na-ebute mwakpo ndị ọchịehi na Benue, Platu, Adamawa, Nasarawa na Taraba steeti, mana ugbua, ọ bụzị nkata a kpara nke ọma imemina mmadụ.

Akara ntụ-ntụ
Ụlọ a gbara ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ ihe fọdụrụ n'ụlọ ndị mmadụ ndị ọchịehi mebiri na Jos

Lee ihe buliri mkpamkpa ndị ọchịehi n'afọ a

Agbanyeghị na o teela nsogbu ndị ọchịehi bidoro n'etiti ha na ndị ọrụugbo, nke aafọ a boliri uzu nke ukwuu. Lee ihe ndị ICG kwuru kpatara ya;

  • Mmebi gburugburu na ụdịdị gburugburu mpaghara ugwu Naịjirịa maka aja si na dezat ekpochi ebe ha na-azụ anụ. Nke a mere ndị ọchị ehi ji awakpozi obodo ndị dị na mpaghara etiti Naịjirịa na steeti ndị dị ebe ahụ
  • Gọọmenti egeghi ntị ma ndị obodo kpọọ ha: Ọtụtụ oge ka obodo ndị a wakporo na-ekwu na ha gwara ndị uweojii maọbụ ndị agha na mwakpo na-abịa mana ha anaghị abịa n'oge maọbụ ha bịasịa pụọ, ndị ọchịehi awakpokwa ha. Ndị ICG kwuru na nke a so awunye mmanụ n'ọkụ ya bụ mkpamkpa
  • Gọọmenti anaghị ata ndị na-akpa arụ ahụhụ kwesiri ha: Ha kwuru na ndị gọọmenti na-agbalị mana ha anaghị eji aka ike eso ndị na-eme mwakpo ahụ n'obodo dị icheiche. Nke a nwereike ime ha na-eme ihe chọrọ maka na a naghị ata ha ahụhụ ndị kwesiri ndị mere ụdị arụ ha na-emel
  • Iwu ndị machiri ịchụehi na mbara nke steeti ụfọdụ hibere: Steeti Benue na Taraba hibere iwu ọhụrụ nke na-anaghị ekwe ka mmadụ ọbụla chịa ehi na mbara na gburugburu steeti ahụ. ICG kwuru na iwu ahụ so kpalie ndị ọchịehi ahụ maka na ọ dị ka ọ na-amachi ha ime ihe gbasara ha b.ụ ịchụehi n'ebe ha chọrọ ịchụ ya. Man aka na-achị Benue steeti bụ Samuel Ortom ekwuola ugboro ugboro na o meghi iwu ahụ iji megide mmadụ mana ọ bụ iji kwụsị esemokwu dị n'etiti ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo nke na-ememina ndụ ndị mmadụ na steeti ahụ. Mịnịsịta na-ahụ maka ọrụ ugbo bụ Audu Ogbeh bụkwa onye Benue steeti ekwukwaala na mwakpo ahụ na-eme na steeti ahụ abụghị maka iwu ahụ.
Ụlọ a gbara ọkụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ebe ụlọ a dị otu a, ajụjụ ga-abụ ma o nwekwara onye si n'ime ya pụta maka na ndị ọchịehi na-eji abalị agba ụlọ ndị mmadụ ọkụ

Gịnị ka a ga-eme?

Ọ bụghị naanị nsogbu ka akwụkwọ ahụ kwuru maka ya, ha tụtakwara aro etu a ga-esi mezie ihe ahụ ka ọ dị mma.

  • Ha kwuru na gọọmenti etiti Naịjirịa kwesiri ịchekwa ma ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi ime ka mmadụ niile nwee nchekwube na ha nwere nchekwa tọrọ atọ n'aka gọọmenti
  • Ọzọ dị ka ibe ya bụ ịa ndị niile na-eme mkpaamkpa n'obodo dị icheiche ahụhụ dịrị ha na-ekweghi ka onye ọbụla gbalaa n'efu maọbụ na-ataghị ahụhụ njọ ya
  • Ha kwukwara ka gọọmenti etiti malite mgbanwe banyere ịụ anụ na Naịjirịa ebe ha kwuru ka gọọmenti steei jiri nwayọọ na-ewepụa atụmatụ ịmachị ịchịehi na mbara steeti ha
  • Akwụkwọ ahụ kwukwara mkpa ọ dị ka ndị isi obodo ghara ikwe ka a na-akọ ọnụ maọbụ na-ekwu ajọ okwu megide onye ọbụla kama ka ha kwadoo mkparịtaụka n'etiti ndị obodo ha na ndị ọchịehi nakwa ikwado atụmatụ ga-eweta udo
  • Ndị mba ọzọ nyere Naịjirịa aka ma kwado mgbanwe a ga-eme n'atụmatụ ịzụ anụmanụ na Naịjirịa nke a kpọrọ 'National Livestock Transformation Plan" na Bekee.

Mkpamkpa ndị ọchịehi kparala na Benue, Platu na Taraba steeti kamgbe afọ 2018 ka jọ karịa na mgbe mbụ nke mere ọtụtụ mmadụ welitere isi na Naịjirịa ji akatọ onyeisiala Buhari maka na o meghi ihe siri ike iji kwụsịmaọbụ belata mwakpo ahụ.

BBC Igbo gbalịrị inweta onye nkwuchiteọnụ onyeisiala bụ Garba Shehu ka o tinye ọṅụ nokwu mana ọ zaghị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị: