Ụka Metọdist: Kpọọ ndị ọchịehi 'ndị oyiegwu'

Ebe foto si, Getty Images
Ụka Metọdist na Naịjirịa akpọkuola onyeisiala Muhammadu Buhari ka o kwupụta ndị ọchịehi dịka otu na-eyi ndụ egwu n'ihi ogbugbu ndị mmadụ ha na-egbu na Naịjirịa.
N'ime ozi onyeisi( Prelate) ụlọụka ahụ bụ Eminensị Samuel Kanu Uche na odeeakwụkwọ ọgbakọ ha bụ Rev. Michael Akinwale wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ndị isi ụlọụka ha mere na Yaba, Legọs Steeti.
Samuel Kanu kwuru na echiche na agwa ndị ọchịehi mere ka ha dịka ndị Boko Haram bụ ndị a kpọrọ otu na-eyi ndụ egwu kemgbe 2013.
Onyeisi ụka ahụ katọrọ ọchịchị Buhari maka ịkpọ otu Ipob ndị na-eyi egwu ma gbaa nkịtị n'okwu gbasara ndị ọchịehi.
Ọ katọkwara ogbugbu ndị ụka kraịst na ndị ụkọchukwu ụka Katọlik abụọ na Benue Steeti ma kpọkuo ọchịchị Buhari ka o cheekwa ndụ ndị Naịjirịa agbanyeghị okpukperechi ha.
O kelere gọọmentị na mkpebi ha igbochi ịchịgharị ehi ma hiwe ọdọ ebe a na-azụ ehi iji kwụsị ogbugbu ndị mmadụ.
" E kwesiri ime ihe niile iji kwado ịdịnotu n'etiti ndị Naịjiria agbanyeghị okpukpere chi ọbụla.
O kwukwara na ndị ọrụ nchekwa ala Naịjirịa anaghị arụkọ ọrụ ọnụ bụ nke mere e ji tọọrọ ụmụakwụkwọ Dapchi na Yobe Steeti.

Akụkọ ga-amasị gị:










