Lee ihe ndị Buhari na Trump kpara

Onyeisiala Buhari na Traump
Nkọwa foto, Ogbugbu ndị nso Kraist na-ewe Trump iwe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Buhari bụ onyeisiala ojii nke mbụ ị ga leta Trump kemgbe ọ rịgoro ọkwa ọchịchị n'afọ 2017.

N'akụkọ kachasị ha kpara bụ maka nchekwa na ị luso ndị na-eyi ndụ egwu bụ Boko Haram agha.

Buhari kelere Trump maka enyemaka ndị mba Amerịka na-enye ha n'ịlụ ọgụ a ma sị kwa ya ndewo maka ihe ọ na-eme ị bugote akụnaụba mba Amerịka

O kwere Trump nkwa na ya na ndị agha Naịjirịa na-agba mbo ị gbapụta ụmụakwụkwọ ndị Chibok atọrọ n'afọ 2014.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Lee ihe ndị ha kpara n'uju ebe a:

Akụnaụba mba abụọ

okoloto Naịjiria na Amerịka

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI

Trump kwuru na o nwere olileanya na Naịjirịa ga-agbanwe ụfọdụ iwu ha iji nye mba Amerịka ohere ị bubata ngwa ahịa ha dị ịcheịche n'ala Naịjirịa.

Okwu nchekwa:

Ugboelu agha

Ebe foto si, AFP

Trump na-ekwu kwa na ya ndị gọọmentị ya ka enye ka hụ na emeriri agha Naịjiria na-ebuso ndị Boko Haram agha. O kwuru na ya ga enye Naịjiria ụgboelu agha iji lụ ọgụ a.

Buhari kelere ya maka nke a.

Trump kwuru "Ezigbo nsogbu dị na Naịjirịa ebe a na-egbu ndị ụka Kraịst, Anyị ga-etinye uchu n'ime nsogbu ahụ maka na anyị agaghị ekwe ka nke ahụ mee.

Ị gba ngbere mmadụ:

Onye a tụrụ ị ga

Ebe foto si, AFP

Okwu a dị mkpa maka na a na-aghọgbu ọtụtụ ụmụnwaanyị Naịjirịa ma kpọfe ha n'ala Amerịka iji ha mere ohu

Trump sị na ọ ga-arụ ọrụ ị hụ na akwụsiri ihe a maka kachapụ ya n'akụkọ a na-anụ maka Naịjirịa.

O kwụkwara na ọ ga-amasị ya ị bịa leta ala Naịjirịa n'oge adịghị anya maka na ndị mmadụ na-agwa ya na Naịjirịa bụ ala mara mma.