Akụkọ ndị dị mkpa na mgbede a: Lee aha mmadụ 30 ga-asọ mpi iko mbaụwa
Akụkọ ndị dị mkpa n'abali a:

Ogbunigwe si n'ime ala gbara n'ime ụlọụka Katọlik, Holy Cross dị n'obodo Iji-Nike dị n'Enugwu steeti.
Ndị na-aka ụka ebe ahụ kwuru na ha nụrụ ụda ya tupu ụka ụtụtụ ebido mana obi ụtọ ha bụ na onweghị onye nwụrụ.
Ebe ọzọ na Naịjirịa
Taa bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ nke afọ iri na ise nke Leah Sharibu bụ nwatakwụkwọ ndị Boko Haram tọọrọ n'obodo Dapchi.
Cheta na ndị Boko Haram hapụrụ ụmụakwụkwọ ibe ya ruru otu narị ma jụ ịhapụ ya maka na ọ bụ onye ụka Kraịst.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, AFP
Ọtụtụ ndị mmadụ anwụọla ka ndị mba Amerịka mepere ụlọ ọrụ nnọchiteanya ha na Jerusalem.
Ihe ruru mmadụ iri anọ na atọ nwụrụ ebe ihe ruru puku abụọ na narị abụọ merụrụ ahụ ka ndị agha Israel lusoro ha ọgụ.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị otu NFF ewepụtala aha mmadụ iri atọ ga-anọchite anya Naịjirịa n'asọmpi iko mbaụwa.
Ndị dịka Kenneth Omeruo, Mikel, Iwobi, Victor Moses nakwa Kelechi Iheanacho bụ ndị akpọrọ aha.
Gee nkeji anyị na mgbede a:
Ihe nkiri taa
Na mkparịtaụka BBC na onye ọkpaọchị ama ama bụ Uche Ogbuagu o kwuru na ọrụ ya emela ka ụfọdụ ndị enyi ya gbahapụ ya.
O kwukwara ihe o jiri gbaa arụkwaghị na gọọmenti Imo Steeti mgbe ọ rụrụ ọrụ ebe ahụ.











