ADF na ndi Igbo bi na Chicago etiela aka n'ala maka nnwereonwe Igbo

Ọgbakọ Ndịgbo na US

Ebe foto si, Prof. Nwala

Nkọwa foto, Chief Friday Nwokoma Onwukwe (Onyeisi ndị Igbo na Chicago); Chief Eddie Nwosu (Onye nchịkọta ọgbakọ a); Ọkammụta Uzodinma Nwala (Onyeisi ADF) na ndị ọzọ

Ndigbo bi na Chicago dị na mba Amerịka akwadola mkpebi ogbakọ ndigbo mere n'Enugwu n'ọnwa Julaị afọ 2018, nke Onyeisiala Muhammadu Buhari sị na ya bụ mkpebi bụ ike otu onye na ya ekwenyeghị na ya.

Ndị otu a kwuru ihe a mgbe ha nabatara ndị isi Alaigbo Development Foundation (ADF) bụ Ọkammụta Uzodinma Nwala, so na ndị gara njem mkparịtaụka na mba ahụ na mkpụrụ ụbọchị itoolu nke Septemba, 2018.

Onye nchịkọta ADF gụpụtaara ndị Igbo bị na Chicago ihe dị na mkpebi ọgbakọ ahụ e mere n'Enugwu bụ nke otu dị iche iche na-akwado nnwereonwe na ọdịmma ndigbo ma nke ha binyekwara aka n'Anambara steeti.

N'okwu ya, Nwala sị na isiokwu ndigbo gbara mkpị abụọ.

Mbụ, ụfọdụ ndịgbo kwenyere na ọ ga-akara ndigbo mma ịnọrọ na Naịjirịa n'olileanya na echi ga-aka mma.

Ndị otu nkwenye a na-ekwukwa na ọ dị mma ndị Igbo na ndị agbụrụ ọbụla nọ na Naịjirịa ịkwụrụ onwe ha ma kwekọrịta ma ha achọrọ ịnọ ka ha achọrọ ịpụ, ma nwekwa ikike ịpụ mgbe ha chọrọ.

Nwala rụtụrụ aka na onweghị mgbe ndigbo kwekọrịtara ịnọ na Naịjirịa dịka ndị ọcha siri gbakwunye onye ọbụla isi n'afọ 1914.

Ọgbakọ Ndịgbo na US

Ebe foto si, Úzódínma Nwala

Nkọwa foto, Ọkamụta Uzodinma Nwala

N'ihi ya, ọbụrụ na ndigbo ga-anọ na Naịjirịa, ha ga-enwe ike inwere ala ha, onyinye ọnatarachị ha, nchekwa ha, iwu ha ma nwekwa ohere ha na ndị ọbụla imekọrịta.

Nke abụọ, ndigbo ọzọ kwenyere na afọ otu narị na anọ (104) ndigbo tinyere na Naịjirịa bụ ihe efu nke bụ na ndigbo ga-agawara onwe ha.

Nke bụ na ọbụrụ na ndị isiabaokpu chọrọ ịkpagbu ndigbo ekweghị na atụmatụ udo niile a ewetere, ihe ga-aka mma bụ ka Igbo gawara onwe ha zawa aha ọbụla dị ha mma.

Nwala sị na "nke a dị n'akwụkwọ ikike ọnatarachi nkwekọrịta nke United Nation nakwa nke ọgbakọ nke mba Afrịka".

Ogbakọ Ndịgbo na US

Ebe foto si, Uzodinma Nwala

Nkọwa foto, Ndigbo bi na Chicago, US

Na ngwụcha ọgbakọ a, Igbo Chicago rịọrọ ndị gọọmenti Alaigbo ka ha kwado mbo ADF ma kpọkukwa ndigbo nọ n'ofesi ma ndị nọ n'ụlọ ka ha kwadosie mkpebi ọgbakọ ndigbo mere n'Enugwu nakwa n'Anambara n'agbanyeghị ihe ndị ọchịchị isiabaokpu chọrọ.

N'otu aka ahụ, ha katọkwara ma kagbuo etu esiri kpọchie ụmụnwaanyị Igbo bụ ndị mere ngagharị iwe oge gara aga.

Ha kpọkwara gọọmenti etiti ka ha tọhapụ Nnamdi Kanu na Nna ya na Nne nakwa ndị ọzọ e ji eji maka nnwereonwe Biafra.

Akụkọ ga-amasị gị