NFF Election: Amaju Pinnick ga-achịkwa ọzọ

Ebe foto si, NFF/Twitter
Amaju Pinnick emeriela na ntuliaka ndụ NFF mere taa na Katsina.
Ọ ga-ejikwa oche ya dịka onyeisi otu ahụ.
NFF kwuru na Pinnick nwetara vootu 34 ebe ndị ọzọ bụ Maigara, nwetara vootu 8 ebe Ogunjobi nwetara vootu abụọ ma Okoye enwetaghị vootu ọbụla.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị sonyere na ntuliaka ahụ gụnyere mmadụ 44 nke ndị otu ogbu pịpịrọ na ndị nkuzi bọọlụ sonyere na ya.
Onye nnọchite anya ndị Fifa bụ Luca Piazza na onye nnọchiteanya ndị otu CAF bụ Solomon Mudege bụ ndị si mba ofesi nyochara ntuliaka ahụ.
Ndị na-azọ ya bụ ọkwa bụ

Ebe foto si, Getty Images
1. Amaju Pinnick: Onyeisi otu NFF kamgbe afọ 2014. O ji vootu 32 merie n'ime vootu 44 a tụrụ n'agba nke abụọ ntuliaka afọ ahụ.
Chris Giwa chọrọ ịnara ya ọkwa ahụ n'afọ a dịka ndị ụlọikpe weghachiri ya dịka onyeisi mana Fifa kwuru na ọ bụ naanị Pinnick ka ha ma.
Pinnick bụkwa osote onyeisi mbụ nke otu CAF si Naịjirịa, o nwetara ọkwa ahụ n'afọ a bụ 2018.
2. Aminu Maigari:

Ebe foto si, Getty Images
Maigari chịrị otu NFF otu agba malite n'afọ 2010 rue 2014 mana a chụrụ ya maka okwu gbasara mmebi ego na achịtaghị nke ọma.
Mmadụ asatọ n'ime mmadụ iri na atọ ndị isi otu NFF binyere aka n'akụwkọ e jiri chutuo ya n'afọ 2014.
Maigarị bụbụ onyeisi oche otu na-ahụ maka ndụ na-agba bọọlụ na Bauchi steeti dị afọ 17 gbadaba.
3. Taiwo Ogunjobi: Ogunjobi bụbụ onyeisi ma kuzikwara otu egwu bọọlụ Naịjirịa bụ Shooting Stars nke Ibadan.
Ọ bụbụkwa odeakwụkwọ nke otu NFF malite n'afọ 2002 rue 2005 ma bụrụka onye otu ime obi NFF malite n'afọ 2006 rue afọ 2010.
Ugbua, ọ bụ onyeisi otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Ọsụn steeti.
4. Chinedu Okoye: Okoye bụ onye na-elekọa otu egwu bọọlụ na-etolite etolite bụ Bimo FC.
Ndị a bụ mmadụ anọ ndị na-azọ ọkwa onyeisi NFF ga-achị afọ anọ na-abịa.
Echi ka a ga-ama mbe nabọ nke bụ oke.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










