Gịnị ka ọchụchụ Amaju Pinnick dịka onyeisi NFF ga-apụtara Naịjirịa?

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-ekwu na mịnịsịtri na-ahụ maka egwuregwu enyela iwu ka Amaju Pinnick bụ onyeisi ngalaba na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ nke a kpọrọ Nigeria Football Federation(NFF) irituo n'oche dịka ụlọikpe.
Ụfọdụ na-eche na iwu a mịnịsịtrị a nyere nwere ike itinye Naijiria na nsogbu n'aka otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ na mbaụwa a na-akpọ Fifa n'aha ịchafụ.
Ọnụ na-ekwuchitere Solomon Dalung, mịnịsta egwuregwu, bụ Nneka Anibeze kwuru n'ọ bụ ihe ụlọikpe kwuru ka Amajụ Pinnick na ndị ọzọ kwesịrị iso.
Na mbụ, Fifa akwadoghị ntuliaka nke Giwa na-ekwu na ya meriri n'afọ 2014 ebe otu mbaụwa ahụ kwuburu na ha ga-akwụsị NFF ọrụ n'ike ma ọ bụrụ na ha mee ntuliaka ọzọ.
Agbanyeghị na Pinnick meriri na ntuliaka ahụ emegharịrị, ndị ma ihe a na-ekwu na-akọwa na ntuliaka ahụ akwụghị ọtọ nke mere Giwa jiri gbaa akwụkwọ n'ụlọikpe n'ihi mpụtara ya.
Mana iwu Fifa kwuru na ọ bụrụ na gọọmenti esoro mkpebi ụlọikpe, ọ ga-emegide NFF na iwu ma nwe ike ịkpatara ha ntaramahụhụ.

Ebe foto si, Getty Images
Ọkaiwu NFF bụ Festus Keyamo ebipụtala akwụkwọ ozi o kwuru si n'aka onyeisi Fifa bụ Fatma Samoura e kwuru na ọ bụ Pinnick na ndi otu ya ka ọ ma dịka ndị isi NFF.
N'akwụkwọ ozi ahụ, Samoura kwukwara na Fifa ka kwụ na mmachi ha machiri Giwa.
Cheta na Fifa amachibiola NFF mbụ ka gọọmenti tinyere aka n'okwu NFF.











