A hụla ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha furu kemgbe ụbọchị 9

Ebe foto si, Facebook/Ekatol
Ihe ọma emeela ka a chọtara ụmụaka iri na abụọ na onye nchịkọta otu egwuregwu ha dabara n'ime ọgba na mba Taịland.
Ndị chọtara ha kwuru na ike ka gwụrụ ụmụaka ndị ahụ, maka ọnọdụ ha nọ n'ime ọgba Tham Luang dị na Chiang Rai kemgbe ụbọchị itoolu e bidoro chọwa ha.
Narongsak Osottanakorn bụ gọvanọ obodo Chiang Rai, kwuru na ọ bụ ndị agha mmiri pụrụ iche chọtara ha, ka mmiri ide kpọbara ha ebe ahụ.
Osottanakorn kwuru sị "Ha niile dị ndụ, mana ọrụ anyị agwụbeghị. Ọrụ anyị bụ ịchọ, zọpụta ma kpọghachita ha azụ, ka o si dị ugbua, anyị achọtala ha. Ọrụ anyị ọzọ bụ isi n'ọgba ahụ kpọpụta ha ma kpọlaa ha n'ụlọ."
O kwukwara sị na ha "ga na-agba mbọ na-awụpụta mmiri dị n'ime ọgba ahụ, ma na-eziga ndị dọkịta na nọọsị ga na-amaba na-enyocha ahụike ụmụaka a na onye nchịkọta ha.
Ọ bụrụ na dọkịta kwuo na ahụ esiela ha ike ọfụma etu e nwere ike iji kpọpụta ha, a ga-akpọpụta ha n'ime ọgba ahụ. Anyị ga-elekọta ha anya ruo oge ha ga-alaghachinwu ụlọakwụkwọ."
Jonathan Pakhead bụ onye ntaakụkọ BBC so na ndị bu ụzọ kwuputa maka nchọta ụmụaka a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cheta na ụmụaka ahụ dị afọ site 11 ruo 16, na onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ ha bụ 'Moo Pa'ha gara ilegharị anya n'ọgba a ụbọchị 23 nke ọnwa Juun.










