Ị ma na onyeisi ụka Alakụba zọpụtara ndị ụka Kraist 262 na Plateau?

Mgbe otu ụkochukwu alakọba hụrụ n'ọtụtụ mmadụ na-agba ọsọ ndụ na-agbabata n'ime obodo ya na Ngwa Yelwa n'ụbọchị ụka, ọ nabatara ha n'echighị ugboro abụọ.
Ndị a bụ ndị si Barkin Ladi bụ obodo di nso na Ngwa Yelwa bụ ebe ndị ọchịehi wakporo.
Ọnụọgụgụ ndịuweojii wepụtara bụ na mmadụ iri asatọ n'isii nwụrụ ebe ndị obodo ahụ jisike na-ekwu na ezigbo ọnụọgụgụ ya gafere mmadụ narị abụọ.
Ụkọchukwu a gwara BBC: "Ebum ụzọ zoo ụmụnwaanyị n'ime ụlọ m tupu m kpọrọ ụmụnwoke ga zoo n'ime ụlọ ekpere anyị"
Ọtụtụ ndị zọpụtara onwe ha bụ ndị si Barkin Ladi gbapụ ọsọ gaba obodo dị ha nso bụ Ngwa Yelwa maka mkpuchi.

N'egbughị oge, ndị mmadụ bu egbe bịara sị ya kpọpụta ndị ụka kristi o zoro ka ha gbuo ha mana o kweghị
Ali si: "A gwara m ha na ndị niile nọ n'ụlọekpere anyị bụ ndị ofufe alakoba, e sekpuru m ala rịọ ha ha pụọ ma egbukwana onye ọbụla"

Ọ bụ etu a ka o si chekwa ndụ ndị Berom gbatara ọsọ ndụ n'obodo ahụ, ha ka bi n'ụlọ ekpere ahụ maka ha enweghị ebe ha ga-aga.
N'afọ ole na ole gara aga, mgbe ndị ụka alakoba na-achọ ala iji rụọ ụlọ ekpere, ndị Berom nyere ha ala ahụ n'efụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









