Kedụ ka nne a siri gbuo naanị nwa nwoke o nwere?
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ndị uweojii n'Ụmụahịa Abịa steeti anwụchiela otu nwaanyị gbara nwa ya nwoke ọkụ maka "Memory Card" ekwentị furu efu.
A na-ekwu na nwa ahụ aha ya bụ Odum Prince gbara afọ iri na abụọ.
E bugara ya ụlọọgwụ gọọmenti etiti dị n'Ụmụahịa ụnyaahụ mana ọ nwụrụ n'elekere ise nke ụtụtụ taa.
Onye nkwuchiteọnụ ụlọọgwụ ahụ bụ Darlington Mmadubuko kwuru na ọkụ ahụ gbara nwantakịrị ahụ nke ukwu nke mere na ọ nataghị ọgwụgwọ.
Ndị uweojii kwetere na ihe a mere ma kwuo na ha anwụchiela nwaanyị ahụ.
Onye nkwuchiteọnụ ndị uweojii n'Abịa steeti bụ Geoffrey Ogbonna kwuru na ihe ahụ mere n'Amuzukwu Ibeku n'Ụmụahịa.
N'okwu ya; "Anụrụ m na ọ bụ maka kaadị ahụ furu efu mere nwaanyị ahụ jiri kechie nwa ya aka, wụọ mmanụ ọkụ wee munye ya ọkụ."
Akụkọ na-ebo ebubo na nwa ahụ zuru ya bụ kaadị mana ndị uweojii kwuru na ha ka na-eme nyocha ihe mere.
Tescool kwuru maka ọnwụ nwa hụ n'igwe okwu twitter.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'akụkụ nke ya, I am Freddy One kwuru na nne nwa ahụ wụrụ ya mmanụ ọkụ we munye ya ọkụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3

Akụkọ ndị ga-amasị gị: