NLC protest: Ndịọrụ wujuru ụzọ n'Umuahia, Abakaliki, Lagos, Abuja, mana n'Enugwu ...

Ndịọrụ na-eme ngagharịiwe na Legọs

Ndịọrụ emeela ngagharịiwe na mpaghara dị iche iche Naijiria gụnyere Abakaliki, Umuahia, Aba, Owere, Legos taa dịka ha na-eti mkpụ maka oke ihe isi ike na-aga na Naijiria ugbua.

Mana n'Enugwu mbọ ndị ọrụ gbara ịpụta mee ngagharịiwe kpụrụ afọ n'ala dịka ndị ọrụ nchekwa gbochiri ha.

N'ebe ndị e mere ngaghrịiwe, ọtụtụ ndịọrụ pụtara ama n'ụtụtụ ebe Elekere Asatọ.

.Ụfọdụ bu akwụkwọ na-egosi iwe ha nke ozi dị na ya gụnyere "Kwụsị agụụ", "Naa ndị ọgaranya ụtụisi, tinyere ndị ogbenye ego mkwụbilata ọnụahịa" wdg.

Enugu

Ndịọrụ n'Enugwu
Nkọwa foto, Ndịọrụ Enugwu nọọrọ n'ime ogige ha mee ngaghrịiwe nke ha

N'Enugwu, otu jikọrọ ndịọrụ enweghị ike ime ngagharịwe na gburu gburu Enugwu taata n’ihi na ndị ọrụ nchekwa; ndịuweojii na DSS ekweghi enye ha nchekwa.

Onyeisi NLC ngalaba nke Enugwu bụ ọkaiwu Fabian Nwaigbo kọwara na ha gbakọtara taata iji sonye ndị ogbo ha na Naijirua niile mee ngaghariịwe maka ihe ha kpọrọ "ọnọdụ ọjọọ na obodọ anyị".

NLC Enugu

Mana dịka o siri kọwaa, ndị uweojii na DSS kwuru na ha agaghị enye ha nchekwa na ya.

Nke mere ha jiri nọrọzịa n’ime ụlọọrụ NLC n’Enugwu mee ya bu ngagharịiwe.

Nwaigbo kwukwara na ụfọdụ ndị kwesiri isonye ha apụtaghị n’uju.

Ndị rụ ahụ gbakọrọ bucha akwụkwọ edegasịrị iwe ha were na-agụ egwu akpaghrị gburu gburu ahụ, na-ayọ gọmenti ka ọgbatara ha ọsọ enyemaka.

Ụfọdụ ihe ndịọrụ na-arịọ gụnyere iwegota ego ugwọọnwa opekatampe, ikwalite nchekwa nakwa imezi ego dọla ka o si emetụta ọnụahịa.

Otu na-akwado Gọọmentị Etiti emeela ngagharị nke ha
Ndi goomenti

Otu amaghị aha ha apụtala ime ngagharị iji kwado gọọmenti etiti

Onye ntaakụkọ BBC hụrụ ebe ihe mere kwuru na ndị ahụ pụtara dịka otu NLC mechara ngagharị nke ha laa.

Ndị ahụ gbakọro n'ihu ụlọọrụ ndị omeiwu bucha akwụkwọ e dere ụfọdụ ihe na ya.

Ha dere "ihere mee ndị ilo Naijiria" "Tinubu na-ahazigharị Naijiria" na ihe ndị ọzọ

Ndi goomenti

NLC amalitela abụbụọrụ ha n'uju na Naijiria niile

Joe Ajero

Otu jikọrọ ndị ọrụ na Naịjirịa bụ NLC n'ịchafụ amalitela abụbụọrụ ha taa dịka ha si kwuo.

Onyeisioche otu ahụ bụ Joe Ajero edurula ndị pụtara isonye na ya bụ ihe gawa n'ụlọọrụ ndị omeiwu Naịjirịa.

Ajero kpọrọ oku abụbụọrụ a iji gosi iwe ha maka etu ihe isi ike nakwa ahụhụ si ju ebe niile na Naịjirịa. 

O kwukwara na e kwesịrị iwelite ụgwọ opekatampe ka ọ bụrụ otu nde naira dịka ọnụ ahịa na-arị elu kwa ụbọchị.

Ndị uweojii pụrụiche bụ DSS dọrọ Ajero na otu ya aka na ntị ma sị ha emela abụbụọrụ ọbụla kama ha nye ọchịchị Tinubu obere oge iji hazie onwe ya. 

Ajero zaghachiri ha sị ha na ọ bụghị ọrụ ha ị ghọrọ gọọmentị ọnụ na-ekwuru ha.

Lee ka o si aga ebe dị iche iche ugbua. 

Abuja

Abubuoru NLC

Ajero edurula ndị niile pụtara isonye ya bụ abụbụọrụ n'ụlọọrụ ndị omeiwu.

O dobeghi anya ihe ọ na-akwado ime ma ha rue ebe ahụ.

Onye ntaakụkọ BBC hụkwara ebe ndị uweojii so ndị pụtara n'azụ iji nye ha nchekwa.

Abubuoru NLC

Ebonyi

Abubuoru NLC

Ndị mmadụ apụtala n'igwe ha n'Abakaliki bụ isi obodo Ebonyi steeti.

Onyeisi ndị NLC na steeti ahụ bụ Ogugua Egwu pụtara idu ndị nke ya n'abubuoru ha na-eme.

Egwu nyere ndị otu ya nkwado nakwa ozi ika ha obi na ya bụ ihe.

Abubuoru NLC

Legos

Abubuoru NLC
Abubuoru NLC